< Abụ Ọma 12 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma nke Devid. Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla! Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ.
Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Monga mwa mayimbidwe seminiti. Salimo la Davide. Thandizeni Yehova pakuti palibe munthu wokhulupirika; okhulupirika akusowa pakati pa anthu.
2 O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha.
Aliyense amanamiza mʼbale wake; ndi pakamwa pawo pabodza amayankhula zachinyengo.
3 Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.
Inu Yehova tsekani milomo yonse yachinyengo ndi pakamwa paliponse podzikuza.
4 Ndị na-asị, “Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?”
Pakamwa pamene pamati, “Ife tidzapambana ndi kuyankhula kwathu; pakamwapa ndi pathupathu, tsono mbuye wathu ndani?”
5 “Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.”
“Chifukwa cha kuponderezedwa kwa anthu opanda mphamvu ndi kubuwula kwa anthu osowa, Ine ndidzauka tsopano,” akutero Yehova, “Ndidzawateteza kwa owazunza.”
6 Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke, ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ, nke a nụchara ugboro asaa.
Ndipo mawu a Yehova ndi angwiro monga siliva oyengedwa mʼngʼanjo yadothi, oyengedwa kasanu nʼkawiri.
7 O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Inu Yehova mudzatitchinjiriza ndipo mudzatiteteza kwa anthu otere kwamuyaya.
8 Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.
Oyipa amangoyendayenda ponseponse anthu akamayamikira zochita zawo.

< Abụ Ọma 12 >