< Abụ Ọma 119 >
1 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị.
Happy are they who are upright in their way, Who walk in the law of the LORD!
2 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.
Happy are they who observe his ordinances, And seek him with their whole heart;
3 Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile.
Who also do no iniquity, But walk in his ways!
4 I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi.
Thou hast commanded us to keep thy precepts diligently.
5 Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile!
O that my ways were directed to keep thy statutes!
6 Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.
Then shall I not be put to shame, When I have respect to all thy commandments.
7 Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.
I will praise thee in uprightness of heart, When I shall have learned thy righteous laws.
8 Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m.
I will keep thy statutes; Do not utterly forsake me!
9 Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.
How shall a young man keep his way pure? By taking heed to it according to thy word.
10 Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.
With my whole heart have I sought thee; O let me not wander from thy commandments!
11 Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị.
Thy word have I hid in my heart, That I might not sin against thee.
12 Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị; kuziere m iwu gị niile.
Blessed be thou, O LORD! O teach me thy statutes!
13 Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị.
With my lips do I declare All the precepts of thy mouth.
14 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.
In the way of thine ordinances I rejoice As much as in all riches.
15 Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.
I meditate on thy precepts, And have respect unto thy ways.
16 Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya.
I delight myself in thy statutes; I do not forget thy word.
17 Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi.
Deal kindly with thy servant, that I may live, And have regard to thy word!
18 Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.
Open thou mine eyes, That I may behold wondrous things out of thy law!
19 Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile.
I am a stranger in the earth; O hide not thy precepts from me!
20 Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ.
My soul breaketh within me, On account of longing for thy judgments at all times.
21 Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.
Thou rebukest the proud, the accursed, Who wander from thy commandments.
22 Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.
Remove from me reproach and contempt, For I have kept thine ordinances!
23 Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị.
Princes sit and speak against me, But thy servant meditateth on thy statutes.
24 Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m.
Thine ordinances are my delight; Yea, they are my counsellors.
25 Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.
My soul cleaveth to the dust; O revive me, according to thy word!
26 Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị.
I have declared my ways, and thou hast heard me; Teach me thy statutes!
27 Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile.
Make me to understand the way of thy precepts! So will I meditate upon thy wonders.
28 Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị.
My soul weepeth for trouble; O lift me up according to thy promise!
29 Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara.
Remove from me the way of falsehood, And graciously grant me thy law!
30 Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.
I have chosen the way of truth, And set thy statutes before me.
31 O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m.
I cleave to thine ordinances; O LORD! let me not be put to shame!
32 Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.
I will run in the way of thy commandments, When thou shalt enlarge my heart.
33 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.
Teach me, O LORD! the way of thy statutes, That I may keep it to the end!
34 Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi.
Give me understanding, that I may keep thy law; That I may observe it with my whole heart!
35 Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.
Cause me to tread in the path of thy commandments, For in it I have my delight.
36 Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.
Incline my heart to thine ordinances, And not to the love of gain!
37 Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.
Turn away mine eyes from beholding vanity, And quicken me in thy law!
38 Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị.
Fulfill to thy servant thy promise, Which thou hast made to him who feareth thee!
39 Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.
Turn away the reproach which I fear; For thy judgments are good.
40 Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị.
Behold, I have longed for thy precepts; O quicken thou me in thy righteousness!
41 O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị;
Let thy mercies come to me, O LORD! And thy help according to thy promise!
42 mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.
So shall I be able to answer him that reproacheth me; For I trust in thy promise.
43 Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.
O take not the word of truth utterly out of my mouth! For I trust in thy judgments.
44 Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi.
So shall I keep thy law continually, For ever and ever.
45 Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
I shall walk in a wide path; For I seek thy precepts.
46 Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m,
I will speak of thine ordinances before kings, And will not be ashamed.
47 nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya.
I will delight myself in thy commandments, which I love;
48 Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.
I will lift up my hands to thy precepts, which I love; I will meditate on thy statutes.
49 Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya.
Remember thy promise to thy servant, Because thou hast caused me to hope!
50 Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m.
This is my comfort in my affliction; For thy promise reviveth me.
51 Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m.
The proud have had me greatly in derision; Yet have I not swerved from thy law.
52 O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi.
I remember thy judgments of old, O LORD! And I comfort myself.
53 Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ.
Indignation burneth within me, On account of the wicked who forsake thy law.
54 Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ.
Thy statutes have been my song In the house of my pilgrimage.
55 Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị.
In the night, O LORD! I think of thy name, And keep thy law!
56 Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi.
This have I as my own, That I keep thy precepts.
57 O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.
Thou art my portion, O LORD! I have resolved that I will keep thy precepts.
58 Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị.
I have sought thy favor with my whole heart; Be gracious unto me according to thy promise!
59 Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile.
I think on my ways, And turn my feet to thy statutes;
60 Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi.
I make haste, and delay not, To keep thy commandments.
61 A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị.
The snares of the wicked surround me; Yet do I not forget thy law.
62 Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi.
At midnight I rise to give thanks to thee On account of thy righteous judgments.
63 Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.
I am the companion of all who fear thee, And who obey thy precepts.
64 O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile.
The earth, O LORD! is full of thy goodness; O teach me thy statutes!
65 Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị.
Thou dost bless thy servant, O LORD! According to thy promise!
66 Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile.
Teach me sound judgment and knowledge! For I have faith in thy commandments.
67 Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi.
Before I was afflicted, I went astray; But now I keep thy word.
68 I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile.
Thou art good and doest good; O teach me thy statutes!
69 Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị.
The proud forge lies against me, But I keep thy precepts with my whole heart.
70 Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị.
Their heart is senseless like fat; But I delight in thy law.
71 Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile.
It is good for me that I have been afflicted, That I might learn thy statutes.
72 Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo.
The law of thy mouth is better to me Than thousands of gold and silver.
73 Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.
Thy hands have made and fashioned me; Give me understanding, that I may learn thy commandments!
74 Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.
They who fear thee shall see me and rejoice, Because I trust in thy word.
75 O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ.
I know, O LORD! that thy judgments are right, And that in faithfulness thou hast afflicted me.
76 Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.
O let thy loving-kindness be my comfort, According to thy promise to thy servant!
77 Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m.
Let thy tender mercies come to me, that I may live! For thy law is my delight.
78 Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.
May the proud be put to shame, who wrong me without cause! But I will meditate on thy precepts.
79 Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile.
Let those who fear thee turn unto me, And they that know thine ordinances!
80 Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m.
May my heart be perfect in thy statutes, That I may not be put to shame!
81 Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị.
My soul fainteth for thy salvation; In thy promise do I trust.
82 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”
Mine eyes fail with looking for thy promise; When. say I, wilt thou comfort me?
83 Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile.
Yea, I am become like a bottle in the smoke; Yet do I not forget thy statutes.
84 Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?
How many are the days of thy servant? When wilt thou execute judgment upon my persecutors?
85 Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.
The proud have digged pits for me; They who do not regard thy law.
86 Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha.
All thy commandments are faithful; They persecute me without cause; help thou me!
87 Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ.
They had almost consumed me from the earth; But I forsook not thy precepts.
88 Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị.
Quicken me according to thy loving-kindness, That I may keep the law of thy mouth!
89 O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe.
Thy word, O LORD! abideth for ever, Being established like the heavens;
90 Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike.
Thy faithfulness endureth to all generations. Thou hast established the earth, and it abideth.
91 Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.
They continue to this day according to their ordinances; For they are all subject to thee.
92 A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m.
Had not thy law been my delight, I should have perished in my affliction.
93 Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.
I will never forget thy precepts; For by them thou revivest me.
94 Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
I am thine, help me! For I seek thy precepts.
95 Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.
The wicked lie in wait to destroy me; But I will have regard to thine ordinances.
96 Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ.
I have seen an end of all perfection; But thy law is exceeding broad.
97 O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.
O how I love thy law! It is my daily (meditation)
98 Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile.
Thou hast made me wiser than my enemies by thy precepts; For they are ever before me.
99 Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.
I have more understanding than all my teachers; For thine ordinances are my (meditation)
100 Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.
I have more wisdom than the ancients, Because I keep thy precepts.
101 Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi
I have restrained my feet from every evil way, That I might keep thy word.
102 Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.
I depart not from thy statutes, For thou teachest me!
103 Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!
How sweet are thy words to my taste; Yea, sweeter than honey to my mouth!
104 A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.
From thy precepts I learn wisdom; Therefore do I hate every false way.
105 Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.
Thy word is a lamp to my feet, And a light to my path.
106 Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.
I have sworn, and I will perform it, That I will keep thy righteous statutes.
107 Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị.
I am exceedingly afflicted; Revive me, O LORD! according to thy word!
108 O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile.
Accept, O LORD! the free-will offering of my mouth, And teach me thy statutes!
109 Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị.
My life is continually in my hand; Yet do I not forget thy law.
110 Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.
The wicked lay snares for me, Yet do I not go astray from thy precepts.
111 Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.
I have made thine ordinances my possession for ever; For they are the joy of my heart.
112 Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha.
I have inclined my heart to perform thy statutes, Always, —even to the end.
113 Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
I hate impious men, And thy law I do love.
114 Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị.
Thou art my hiding-place and my shield; In thy word I put my trust!
115 Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m!
Depart from me, ye evil-doers! For I will keep the commandments of my God.
116 Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa.
Uphold me according to thy promise, that I may live; And let me not be ashamed of my hope!
117 Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile.
Do thou hold me up, and I shall be safe, And I will have respect to thy statutes continually!
118 Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi.
Thou castest off all who depart from thy laws; For their deceit is vain.
119 Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya.
Thou throwest away all the wicked of the earth, like dross; Therefore I love thine ordinances.
120 Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.
My flesh trembleth through fear of thee, And I am afraid of thy judgments.
121 Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.
I have done justice and equity; O leave me not to mine oppressors.
122 Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.
Be surety for thy servant for good; Let not the proud oppress me!
123 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.
Mine eyes fail with looking for thy help, And for thy righteous promise.
124 Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.
Deal with thy servant according to thy mercy, And teach me thy statutes!
125 Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.
I am thy servant; give me understanding, That I may know thine ordinances!
126 O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị.
It is time for thee, O LORD! to act; For men have made void thy law.
127 Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
Therefore I love thy commandments above gold; Yea, above fine gold.
128 nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị.
Therefore I esteem all thy precepts concerning all things to be right; I hate every false way.
129 Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi.
Wonderful are thine ordinances; Therefore do I observe them.
130 Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.
The communication of thy precepts giveth light; It giveth understanding to the simple.
131 Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike.
I open my mouth and pant: For I long for thy commandments.
132 Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.
Look thou upon me, and be gracious to me, As is just to those who love thy name!
133 Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m.
Establish my footsteps in thy word, And let no iniquity have dominion over me!
134 Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị.
Redeem me from the oppression of men, So will I keep thy precepts!
135 Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile.
Let thy face shine on thy servant, And teach me thy statutes!
136 Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị.
Rivers of water run down mine eyes, Because men keep not thy law.
137 O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi.
Righteous art thou, O LORD! And just are thy judgments!
138 Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi.
Just are the ordinances which thou hast ordained, And altogether righteous.
139 Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.
My zeal consumeth me, Because my enemies forget thy word.
140 Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.
Thy word is very pure, Therefore thy servant loveth it.
141 Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.
Of mean condition am I, and despised; Yet do I not forget thy precepts.
142 Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu.
Thy righteousness is everlasting righteousness, And thy law is truth.
143 Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.
Trouble and anguish have taken hold of me, But thy laws are my delight.
144 Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.
The justice of thine ordinances is everlasting; Give me understanding, and I shall live!
145 Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.
I cry to thee with my whole heart; Hear me, O LORD! that I may keep thy statutes.
146 Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.
I cry unto thee; save me, And I will observe thine ordinances.
147 Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị.
I come before the dawn with my prayer; I trust in thy promise!
148 Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.
My eyes anticipate the night-watches, That I may meditate upon thy promise.
149 Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị.
Hear my voice according to thy loving-kindness; O LORD! revive me according to thy mercy!
150 Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.
Near are they whose aim is mischief; They are far from thy law;
151 Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.
Yet thou art near, O LORD! And all thy commandments are truth!
152 Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
Long have I known concerning thine ordinances, That thou hast founded them for ever.
153 Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị.
Look upon my affliction, and deliver me! For I do not forget thy law.
154 Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.
Maintain my cause, and redeem me; Revive me according to thy promise!
155 Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.
Salvation is far from the wicked, Because they seek not thy statutes.
156 O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.
Great is thy compassion, O LORD! Revive thou me according to thine equity!
157 Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.
Many are my persecutors and my enemies, Yet do I not depart from thine ordinances.
158 Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.
I behold the transgressors, and am grieved Because they regard not thy word.
159 Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.
Behold, how I love thy precepts! O LORD! revive me according to thy loving-kindness!
160 Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
The whole of thy word is truth, And all thy righteous judgments endure for ever.
161 Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị.
Princes have persecuted me without cause; But my heart standeth in awe of thy word.
162 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
I rejoice in thy word, As one that hath found great spoil.
163 Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
I hate and abhor lying, And thy law do I love.
164 Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi.
Seven times a day do I praise thee On account of thy righteous judgments.
165 Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.
Great peace have they who love thy law, And no evil shall befall them.
166 Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, na-agbasokwa iwu gị niile.
O LORD! I wait for thy salvation, And keep thy commandments!
167 Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.
My soul observeth thine ordinances, And loveth them exceedingly.
168 Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile.
I keep thy precepts and thine ordinances; For all my ways are before thee.
169 Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị.
Let my prayer come near before thee, O LORD! According to thy promise, give me understanding!
170 Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị.
Let my supplication come before thee; O deliver me according to thy promise!
171 Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.
My lips shall pour forth praise; For thou teachest me thy statutes.
172 Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.
My tongue shall sing of thy word; For all thy commandments are right.
173 Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile.
Let thy hand be my help; For I have chosen thy precepts!
174 Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, iwu gị bụ ihe na-amasị m.
I long for thy salvation, O LORD! And thy law is my delight!
175 Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume.
Let me live, and I will praise thee; Let thy judgments help me!
176 Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, chọọ ohu gị, nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.
I wander like a lost sheep; seek thy servant, For I do not forget thy commandments!