< Abụ Ọma 118 >
1 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Mshukuruni Bwana, kwa kuwa ni mwema; upendo wake wadumu milele.
2 Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Israeli na aseme sasa: “Upendo wake wadumu milele.”
3 Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Nyumba ya Aroni na iseme sasa: “Upendo wake wadumu milele.”
4 Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Wote wamchao Bwana na waseme sasa: “Upendo wake wadumu milele.”
5 Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.
Wakati wa maumivu yangu makuu nilimlilia Bwana, naye akanijibu kwa kuniweka huru.
6 Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
Bwana yuko pamoja nami, sitaogopa. Mwanadamu anaweza kunitenda nini?
7 Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.
Bwana yuko pamoja nami, yeye ni msaidizi wangu. Nitawatazama adui zangu wakiwa wameshindwa.
8 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.
Ni bora kumkimbilia Bwana kuliko kumtumainia mwanadamu.
9 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
Ni bora kumkimbilia Bwana kuliko kuwatumainia wakuu.
10 Mba niile gbara m gburugburu ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.
Mataifa yote yalinizunguka, lakini kwa jina la Bwana naliwakatilia mbali.
11 Ha gbara m gburugburu, ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.
Walinizunguka pande zote, lakini kwa jina la Bwana naliwakatilia mbali.
12 Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ, ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ; site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.
Walinizunguka kama kundi la nyuki, lakini walikufa haraka kama miiba iteketeayo; kwa jina la Bwana naliwakatilia mbali.
13 Akwaghachiri m azụ, agaara m ada, ma Onyenwe anyị nyere m aka.
Nilisukumwa nyuma karibu kuanguka, lakini Bwana alinisaidia.
14 Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m.
Bwana ni nguvu yangu na wimbo wangu, yeye amefanyika wokovu wangu.
15 Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!
Sauti za shangwe na ushindi zinavuma hemani mwa wenye haki: “Mkono wa kuume wa Bwana umetenda mambo makuu!
16 Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!”
Mkono wa kuume wa Bwana umeinuliwa juu, mkono wa kuume wa Bwana umetenda mambo makuu!”
17 Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.
Sitakufa, bali nitaishi, nami nitatangaza yale Bwana aliyoyatenda.
18 Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.
Bwana ameniadhibu vikali, lakini hakuniacha nife.
19 Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.
Nifungulie malango ya haki, nami nitaingia na kumshukuru Bwana.
20 Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.
Hili ni lango la Bwana ambalo wenye haki wanaweza kuliingia.
21 Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m.
Nitakushukuru, kwa kuwa ulinijibu, umekuwa wokovu wangu.
22 Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ;
Jiwe walilolikataa waashi, limekuwa jiwe kuu la pembeni.
23 nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.
Bwana ametenda hili, nalo ni la kushangaza machoni petu.
24 Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
Hii ndiyo siku Bwana aliyoifanya, tushangilie na kufurahi ndani yake.
25 O Onyenwe anyị, zọpụta anyị; o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.
Ee Bwana, tuokoe, Ee Bwana, utujalie mafanikio.
26 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.
Heri yule ajaye kwa jina la Bwana. Kutoka nyumba ya Bwana tunakubariki.
27 Onyenwe anyị bụ Chineke, ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke bịaruo nʼebe ịchụ aja.
Bwana ndiye Mungu, naye ametuangazia nuru yake. Mkiwa na matawi mkononi, unganeni kwenye maandamano ya sikukuu hadi kwenye pembe za madhabahu.
28 Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.
Wewe ni Mungu wangu, nitakushukuru, wewe ni Mungu wangu, nitakutukuza.
29 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Mshukuruni Bwana kwa kuwa ni mwema; upendo wake wadumu milele.