< Abụ Ọma 118 >

1 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Oslavujte Hospodina, nebo jest dobrý, nebo na věky trvá milosrdenství jeho.
2 Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Rciž nyní, Izraeli, že na věky milosrdenství jeho.
3 Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Rciž nyní, dome Aronův, že na věky milosrdenství jeho.
4 Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Rcetež nyní bojící se Hospodina, že na věky milosrdenství jeho.
5 Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.
V úzkosti vzýval jsem Hospodina, a vyslyšev, uprostrannil mi Hospodin.
6 Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
Hospodin se mnou, nebudu se báti. Co mi může učiniti člověk?
7 Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.
Hospodin se mnou jest mezi pomocníky mými, pročež já podívám se těm, kteříž mne mají v nenávisti.
8 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.
Lépe jest doufati v Hospodina, než naději skládati v člověku.
9 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
Lépe jest doufati v Hospodina, nežli naději skládati v knížatech.
10 Mba niile gbara m gburugburu ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.
Všickni národové obklíčili mne, ale ve jménu Hospodinovu vyplénil jsem je.
11 Ha gbara m gburugburu, ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.
Mnohokrát obklíčili mne, ale ve jménu Hospodinovu vyplénil jsem je.
12 Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ, ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ; site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.
Ssuli se na mne jako včely, však zhasli jako oheň z trní: nebo ve jménu Hospodinovu vyplénil jsem je.
13 Akwaghachiri m azụ, agaara m ada, ma Onyenwe anyị nyere m aka.
Velmi jsi ztuha na mne dotíral, abych padl, ale Hospodin spomohl mi.
14 Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m.
Síla má a písnička má jest Hospodin, on byl můj vysvoboditel.
15 Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!
Hlas prokřikování a spasení v staních spravedlivých. Pravice Hospodinova dokázala síly,
16 Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!”
Pravice Hospodinova vyvýšila se, pravice Hospodinova dokázala síly.
17 Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.
Neumruť, ale živ budu, abych vypravoval skutky Hospodinovy.
18 Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.
Trestaltě mne přísně Hospodin, ale smrti mne nevydal.
19 Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.
Otevřetež mi brány spravedlnosti, a vejda do nich, oslavovati budu Hospodina.
20 Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.
Tať jest brána Hospodinova, kterouž spravedliví vcházejí.
21 Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m.
Tuť já tě oslavovati budu, nebo jsi mne vyslyšel, a byls můj vysvoboditel.
22 Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ;
Kámen, kterýž zavrhli stavitelé, učiněn jest v hlavu úhelní.
23 nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.
Od Hospodina stalo se to, a jest divné před očima našima.
24 Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
Tentoť jest den, kterýž učinil Hospodin, a protož radujme se a veselme se v něm.
25 O Onyenwe anyị, zọpụta anyị; o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.
Prosím, Hospodine, zachovávejž již; prosím, Hospodine, dávej již šťastný prospěch.
26 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.
Požehnaný, jenž se béře ve jménu Hospodinovu; dobrořečíme vám z domu Hospodinova.
27 Onyenwe anyị bụ Chineke, ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke bịaruo nʼebe ịchụ aja.
Bůh silný Hospodin, onť se zasvítil nám, važte beránky až k rohům oltáře.
28 Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.
Bůh silný můj ty jsi, protož slaviti tě budu, Bože můj, vyvyšovati tě budu.
29 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Oslavujtež Hospodina, neboť jest dobrý, nebo na věky milosrdenství jeho.

< Abụ Ọma 118 >