< Abụ Ọma 117 >

1 Toonu Onyenwe anyị, unu mba niile dị iche iche. Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche.
הללו את-יהוה כל-גוים שבחוהו כל-האמים
2 Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu. Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị!
כי גבר עלינו חסדו-- ואמת-יהוה לעולם הללו-יה

< Abụ Ọma 117 >