< Abụ Ọma 116 >
1 Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.
Ngiyayithanda iNkosi, ngoba izwile ilizwi lami, ukunxusa kwami.
2 Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile.
Ngoba ibeke indlebe yayo kimi, ngakho ngizayibiza ensukwini zami.
3 Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. (Sheol )
Izibopho zokufa zangihanqa, lenhlungu zesihogo zangibamba; ngathola inhlupheko losizi. (Sheol )
4 Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!”
Ngasengibiza ibizo leNkosi, ngathi: O Nkosi, khulula umphefumulo wami.
5 Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.
Ilomusa iNkosi, ilungile; ye, uNkulunkulu wethu ulesihawu.
6 Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.
INkosi iyabalondoloza abathobekileyo; ngehliselwa phansi, yasingisindisa.
7 Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.
Buyela, mphefumulo wami, ekuphumuleni kwakho, ngoba iNkosi ikuphethe ngomusa.
8 Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
Ngoba ikhulule umphefumulo wami ekufeni, amehlo ami ezinyembezini, unyawo lwami ekuweni.
9 ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.
Ngizahamba phambi kweNkosi emazweni abaphilayo.
10 Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”
Ngakholwa, ngakho ngikhulumile. Mina ngahlupheka kakhulu.
11 nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”
Mina ngathi ekuphangiseni kwami: Wonke umuntu ungumqambimanga.
12 Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?
Ngizabuyiselani eNkosiningazo zonke inzuzo zayo kimi?
13 Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
Ngizathatha inkezo yosindiso, ngibize ibizo leNkosi.
14 Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.
Ngizakhokha izifungo zami eNkosini, khathesi phambi kwabantu bayo bonke.
15 Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.
Kuligugu emehlweni eNkosi ukufa kwabangcwele bayo.
16 O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.
Hawu Nkosi, isibili ngiyinceku yakho, ngiyinceku yakho, indodana yencekukazi yakho; uthukulule izibopho zami.
17 Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
Ngizakuhlabela umhlatshelo wokubonga, ngibize ibizo leNkosi.
18 Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,
Ngizakhokha izifungo zami eNkosini, khathesi phambi kwabantu bayo bonke,
19 nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị, nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.
emagumeni endlu yeNkosi, phakathi kwakho, Jerusalema. Dumisani iNkosi!