< Abụ Ọma 116 >

1 Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.
여호와께서 내 음성과 내 간구를 들으시므로 내가 저를 사랑하는도다
2 Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile.
그 귀를 내게 기울이셨으므로 내가 평생에 기도하리로다
3 Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. (Sheol h7585)
사망의 줄이 나를 두르고 음부의 고통이 내게 미치므로 내가 환난과 슬픔을 만났을 때에 (Sheol h7585)
4 Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!”
내가 여호와의 이름으로 기도하기를 여호와여 주께 구하오니 내 영혼을 건지소서 하였도다
5 Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.
여호와는 은혜로우시며 의로우시며 우리 하나님은 자비하시도다
6 Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.
여호와께서는 어리석은 자를 보존하시나니 내가 낮게 될 때에 나를 구원하셨도다
7 Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.
내 영혼아 네 평안함에 돌아갈지어다 여호와께서 너를 후대하심이로다
8 Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
주께서 내 영혼을 사망에서, 내 눈을 눈물에서, 내 발을 넘어짐에서 건지셨나이다
9 ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.
내가 생존 세계에서 여호와 앞에 행하리로다
10 Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”
내가 믿는고로 말하리라 내가 큰 곤란을 당하였도다
11 nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”
내가 경겁 중에 이르기를 모든 사람은 거짓말장이라 하였도다
12 Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?
여호와께서 내게 주신 모든 은혜를 무엇으로 보답할꼬
13 Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
내가 구원의 잔을 들고 여호와의 이름을 부르며
14 Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.
여호와의 모든 백성 앞에서 나의 서원을 여호와께 갚으리로다
15 Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.
성도의 죽는 것을 여호와께서 귀중히 보시는도다
16 O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.
여호와여 나는 진실로 주의 종이요 주의 여종의 아들 곧 주의 종이라 주께서 나의 결박을 푸셨나이다
17 Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
내가 주께 감사제를 드리고 여호와의 이름을 부르리이다
18 Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,
내가 여호와의 모든 백성 앞에서 나의 서원을 여호와께 갚을지라
19 nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị, nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.
예루살렘아, 네 가운데서, 여호와의 전 정에서 내가 갚으리로다 할렐루야

< Abụ Ọma 116 >