< Abụ Ọma 115 >

1 Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.
Not unto us, O LORD, not unto us, but unto thy name give glory, for thy mercy, and for thy truth’s sake.
2 Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?”
Wherefore should the nations say, Where is now their God?
3 Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
But our God is in the heavens: he hath done whatsoever he pleased.
4 Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ.
Their idols are silver and gold, the work of men’s hands.
5 Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
They have mouths, but they speak not; eyes have they, but they see not;
6 ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla;
They have ears, but they hear not; noses have they, but they smell not;
7 ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla.
They have hands, but they handle not; feet have they, but they walk not; neither speak they through their throat.
8 Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.
They that make them shall be like unto them; yea, every one that trusteth in them.
9 Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
O Israel, trust thou in the LORD: he is their help and their shield.
10 Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
O house of Aaron, trust ye in the LORD: he is their help and their shield.
11 Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
Ye that fear the LORD, trust in the LORD: he is their help and their shield.
12 Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị, ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel, ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn,
The LORD hath been mindful of us; he will bless [us]: he will bless the house of Israel; he will bless the house of Aaron.
13 ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma onye nta ma onye ukwu.
He will bless them that fear the LORD, both small and great.
14 Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa, unu na ụmụ unu.
The LORD increase you more and more, you and your children.
15 Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa gọzie unu.
Blessed are ye of the LORD, which made heaven and earth.
16 Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị, ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile.
The heavens are the heavens of the LORD; but the earth hath he given to the children of men.
17 Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị, ndị na-arịda nʼebe ịnọ duu;
The dead praise not the LORD, neither any that go down into silence;
18 ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma, site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị.
But we will bless the LORD from this time forth and for evermore. Praise ye the LORD.

< Abụ Ọma 115 >