< Abụ Ọma 115 >

1 Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.
Kwa ife ayi Yehova, kwa ife ayi koma ulemerero ukhale pa dzina lanu, chifukwa cha chikondi chanu chosasinthika ndiponso chifukwa cha kukhulupirika kwanu.
2 Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?”
Chifukwa chiyani anthu a mitundu ina akunena kuti, “Mulungu wawo ali kuti?”
3 Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
Mulungu wathu ali kumwamba; Iye amachita chilichonse chimene chimamukondweretsa.
4 Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ.
Koma mafano awo ndi siliva ndi golide, opangidwa ndi manja a anthu.
5 Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
Pakamwa ali napo koma sayankhula, maso ali nawo koma sapenya;
6 ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla;
makutu ali nawo koma samva, mphuno ali nazo koma sanunkhiza;
7 ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla.
manja ali nawo koma akakhudza samva kanthu; mapazi ali nawo koma sayenda; kapena pakhosi pawo kutulutsa mawu.
8 Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.
Anthu amene amapanga mafanowo adzafanana nawo, chimodzimodzinso onse amene amadalira mafanowo.
9 Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
Inu Aisraeli, dalirani Yehova; Iye ndiye thandizo lanu ndi chishango chanu.
10 Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
Iwe nyumba ya Aaroni, dalira Yehova; Iye ndiye thandizo lako ndi chishango chako.
11 Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
Inu amene mumaopa Iye, dalirani Yehova; Iye ndiye thandizo lanu ndi chishango chanu.
12 Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị, ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel, ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn,
Yehova watikumbukira ndipo adzatidalitsa: adzadalitsa nyumba ya Israeli, adzadalitsa nyumba ya Aaroni,
13 ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma onye nta ma onye ukwu.
adzadalitsa iwo amene amaopa Yehova; aangʼono ndi aakulu omwe.
14 Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa, unu na ụmụ unu.
Yehova akuwonjezereni madalitso; inuyo pamodzi ndi ana anu.
15 Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa gọzie unu.
Mudalitsidwe ndi Yehova, Wolenga kumwamba ndi dziko lapansi.
16 Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị, ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile.
Kumwamba ndi kwa Yehova, koma dziko lapansi Iye walipereka kwa anthu.
17 Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị, ndị na-arịda nʼebe ịnọ duu;
Si anthu akufa amene amatamanda Yehova, amene amatsikira kuli chete;
18 ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma, site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị.
ndi ife amene timatamanda Yehova, kuyambira tsopano mpaka muyaya. Tamandani Yehova.

< Abụ Ọma 115 >