< Abụ Ọma 114 >

1 Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
בצאת ישראל ממצרים בית יעקב מעם לעז׃
2 Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke, Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
היתה יהודה לקדשו ישראל ממשלותיו׃
3 Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ, osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ;
הים ראה וינס הירדן יסב לאחור׃
4 Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule; ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
ההרים רקדו כאילים גבעות כבני צאן׃
5 Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ? Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
מה לך הים כי תנוס הירדן תסב לאחור׃
6 Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule? Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
ההרים תרקדו כאילים גבעות כבני צאן׃
7 Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
מלפני אדון חולי ארץ מלפני אלוה יעקב׃
8 onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri, onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.
ההפכי הצור אגם מים חלמיש למעינו מים׃

< Abụ Ọma 114 >