< Abụ Ọma 114 >
1 Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
Sa’ad da Isra’ila ya fito daga Masar, gidan Yaƙub daga mutane masu baƙon harshe,
2 Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke, Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
Yahuda ya zama wuri mai tsarki na Allah, Isra’ila mallakarsa.
3 Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ, osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ;
Teku ya kalla ya kuma gudu, Urdun ya juye da baya;
4 Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule; ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
duwatsu suka yi tsalle kamar raguna, tuddai kamar tumaki.
5 Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ? Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
Me ya sa, ya teku, kika gudu, Ya Urdun, ka juya baya,
6 Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule? Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
ku duwatsu, kuka yi tsalle kamar raguna, ku tuddai, kamar tumaki?
7 Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
Ki yi rawar jiki, ya duniya, a gaban Ubangiji, a gaban Allah na Yaƙub,
8 onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri, onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.
wanda ya juye dutse ya zama tafki, dutse mai ƙarfi zuwa maɓulɓulan ruwa.