< Abụ Ọma 113 >
1 Toonu Onyenwe anyị! Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya. Toonu aha Onyenwe anyị.
Whakamoemititia a Ihowa. Whakamoemititia, e nga pononga a Ihowa, whakamoemititia te ingoa o Ihowa.
2 Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
Kia whakapaingia te ingo o Ihowa aianei a ake ake.
3 Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.
Kia whakamoemititia te ingoa o Ihowa i te putanga mai o te ra, a tae noa ki tona torengitanga.
4 Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile, ebube ya dị elu karịa eluigwe.
Kei runga rawa a Ihowa i nga iwi katoa: kei runga ake i nga rangi tona kororia.
5 Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị, onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu,
Ko wai te rite ana ki a Ihowa, ki to tatou Atua, kei runga nei tona nohoanga,
6 onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ụwa anya?
E whakaiti nei i a ia ki te titiro iho ki nga mea kei te rangi, kei te whenua?
7 Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;
E whakaara ake ana ia i te iti i roto i te puehu, e whakateitei ake ana i te rawakore i roto i te puranga paru;
8 ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ, ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.
Kia whakanohoia ai e ia ki roto ki nga rangatira, ki nga rangatira o tana iwi.
9 Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi. Toonu Onyenwe anyị.
Nana hoki te pakoko i whai whare ai, hei whaereere e koa ana ki ana tamariki. Whakamoemititia a Ihowa.