< Abụ Ọma 113 >

1 Toonu Onyenwe anyị! Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya. Toonu aha Onyenwe anyị.
할렐루야! 여호와의 종들아 찬양하라! 여호와의 이름을 찬양하라
2 Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
이제부터 영원까지 여호와의 이름을 찬송할지로다
3 Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.
해 돋는 데서부터 해 지는 데까지 여호와의 이름이 찬양을 받으시리로다
4 Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile, ebube ya dị elu karịa eluigwe.
여호와는 모든 나라 위에 높으시며 그 영광은 하늘 위에 높으시도다
5 Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị, onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu,
여호와 우리 하나님과 같은 자 누구리요 높은 위에 앉으셨으나
6 onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ụwa anya?
스스로 낮추사 천지를 살피시고
7 Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;
가난한 자를 진토에서 일으키시며 궁핍한 자를 거름 무더기에서 드셔서
8 ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ, ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.
방백들 곧 그 백성의 방백들과 함께 세우시며
9 Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi. Toonu Onyenwe anyị.
또 잉태하지 못하던 여자로 집에 거하게 하사 자녀의 즐거운 어미가 되게 하시는도다 할렐루야

< Abụ Ọma 113 >