< Abụ Ọma 112 >
1 Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile.
Whakamoemititia a Ihowa. Ka hari te tangata e wehi ana i a Ihowa, e aro nui ana ki ana whakahau.
2 Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.
Ka nui ona uri ki runga ki te whenua; ka manaakitia te whakatupuranga o te hunga tika.
3 Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
Kei tona whare te rawa, te taonga: ka pumau tonu tona tika, ake ake.
4 Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị, nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume.
Ka maea ake te marama i roto i te pouri ki te hunga tika: he atawhai ia, he aroha, he tika.
5 Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe, onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.
He pono ka whiwhi painga te tangata he atawhai, he ohaoha tana mahi: ka u ana kupu i te whakawakanga.
6 Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya; a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
E kore hoki ia e whakangaueuetia ake ake: ka maharatia tonutia te tangata tika ake ake.
7 Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ; obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
E kore ia e mataku i te rongo kino: e u ana tona ngakau, e whakawhirinaki ana ki a Ihowa.
8 Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla; nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri.
Ka u tona ngakau, e kore ia e wehi, kia kite ra ano ia i tana i hiahia ai ki ona hoariri.
9 Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.
Kua tuwhaina e ia, kua hoatu ki te hunga rawakore: pumau tonu tona tika ake ake; ka ara tona haona i runga i te kororia.
10 Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya, ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ; olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.
Ka kite te tangata kino, a ka pouri; ka pakiri ona niho, memeha iho: pirau iho te hiahia o te hunga kino.