< Abụ Ọma 112 >

1 Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile.
Praise ye the LORD! Happy the man who feareth the LORD, Who taketh delight in his commandments!
2 Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.
His posterity shall be mighty on the earth; The race of the righteous shall be blessed.
3 Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
Wealth and riches shall be in his house; His righteousness shall endure for ever.
4 Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị, nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume.
To the righteous shall arise light out of darkness; He is gracious and full of compassion and righteousness.
5 Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe, onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.
Happy the man who hath pity and lendeth! He shall sustain his cause in judgment;
6 Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya; a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
Yea, he shall never be moved: The righteous shall be in everlasting remembrance.
7 Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ; obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
He is not afraid of evil tidings; His heart is firm, trusting in the LORD.
8 Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla; nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri.
His heart is firm; he hath no fear, Till he see his desire upon his enemies.
9 Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.
He hath scattered blessings; he hath given to the poor; His righteousness shall endure for ever; His horn shall be exalted with honor.
10 Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya, ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ; olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.
The wicked shall see, and be grieved; He shall gnash his teeth, and melt away; The desire of the wicked shall perish.

< Abụ Ọma 112 >