< Abụ Ọma 111 >

1 Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu.
Whakamoemititia a Ihowa. Ka whakapaua toku ngakau ki te whakawhetai ki a Ihowa, i te runanga o te hunga tika, i te whakaminenga.
2 Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha.
He nui nga mahi a Ihowa; e whakatakina ana e te hunga katoa e manako ana ki aua mea.
3 Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
He mea honore, he mea kororia tana mahi: tu tonu tona tika ake ake.
4 O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko.
Kua meinga e ia kia maharatia ana mahi whakamiharo: he atawhai a Ihowa, he aroha.
5 Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
E homai ana e ia he kai ma te hunga e wehi ana ki a ia: ka mahara tonu ia ki tana kawenata.
6 O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile, site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.
Kua whakakitea e ia ki tana iwi te kaha o ana mahi, i tana hoatutanga i to nga tauiwi hei kainga tupu mo ratou.
7 Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi; ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi.
Ko nga mahi a ona ringa he pono, he whakawa tika: pono tonu ana akoranga katoa,
8 E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi, ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi.
U tonu ake ake, e mahia ana i runga i te pono, i te tika.
9 O wetaara ndị ya mgbapụta; o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi, aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu.
I tonoa mai e ia he whakaoranga mo tana iwi: kua kiia iho e ia tana kawenata mo ake tonu atu; he tapu tona ingoa, e wehingia ana.
10 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe; ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta. Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Ko te timatanga o te whakaaro nui he wehi ki a Ihowa: he ngarahu nui to te hunga katoa nana era mahi; mau te whakamoemiti ki a ia, ake ake.

< Abụ Ọma 111 >