< Abụ Ọma 111 >

1 Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu.
הללו-יה אודה יהוה בכל-לבב בסוד ישרים ועדה
2 Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha.
גדלים מעשי יהוה דרושים לכל-חפציהם
3 Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
הוד-והדר פעלו וצדקתו עמדת לעד
4 O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko.
זכר עשה לנפלאותיו חנון ורחום יהוה
5 Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
טרף נתן ליראיו יזכר לעולם בריתו
6 O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile, site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.
כח מעשיו הגיד לעמו-- לתת להם נחלת גוים
7 Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi; ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi.
מעשי ידיו אמת ומשפט נאמנים כל-פקודיו
8 E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi, ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi.
סמוכים לעד לעולם עשוים באמת וישר
9 O wetaara ndị ya mgbapụta; o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi, aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu.
פדות שלח לעמו-- צוה-לעולם בריתו קדוש ונורא שמו
10 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe; ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta. Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
ראשית חכמה יראת יהוה-- שכל טוב לכל-עשיהם תהלתו עמדת לעד

< Abụ Ọma 111 >