< Abụ Ọma 11 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m. Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị, “Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”
Au maître-chantre. — De David. J'ai cherché mon refuge en l'Éternel. Comment dites-vous à mon âme: «Fuis vers tes montagnes, comme l'oiseau!
2 Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.
Car voici que les méchants bandent l'arc; Ils ont ajusté leur flèche sur la corde, Pour tirer, dans l'ombre, sur ceux qui ont le coeur droit.
3 Mgbe a na-ebibi ntọala niile, gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?
Quand les fondements sont renversés, Le juste, que fera-t-il?»
4 Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe. Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.
L'Éternel est dans sa demeure sainte: L'Éternel a son trône dans les cieux. Ses yeux observent; Ses regards sondent les fils des hommes.
5 Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.
L'Éternel sonde le juste; Mais il hait le méchant et celui qui se plaît à la violence.
6 Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.
Il fera pleuvoir sur les méchants Des charbons ardents, du feu et du soufre. Un vent brûlant, tel est le sort qu'ils auront en partage!
7 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.
Oui, l'Éternel est juste; il aime la justice. Les hommes droits contempleront sa face.

< Abụ Ọma 11 >