< Abụ Ọma 11 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m. Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị, “Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”
Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Salimo la Davide. Mwa Yehova ine ndimathawiramo. Nanga mungathe bwanji kunena kwa ine kuti, “Thawira ku phiri lako ngati mbalame.
2 Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.
Pakuti taona oyipa akunga mauta awo; ayika bwino mivi yawo pa zingwe za uta, pobisala pawo kuti alase olungama mtima.
3 Mgbe a na-ebibi ntọala niile, gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?
Tsono ngati maziko awonongeka, olungama angachite chiyani?”
4 Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe. Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.
Yehova ali mʼNyumba yake yoyera; Yehova ali pa mpando wake waufumu kumwamba. Iye amayangʼanitsitsa ana a anthu; maso ake amawayesa.
5 Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.
Yehova amayesa olungama, koma moyo wake umadana ndi oyipa, amene amakonda zachiwawa.
6 Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.
Iye adzakhuthulira pa oyipa makala amoto ndi sulufule woyaka; mphepo yotentha idzakhala yowayenera.
7 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.
Pakuti Yehova ndi wolungama, Iye amakonda chilungamo; ndipo anthu olungama adzaona nkhope yake.

< Abụ Ọma 11 >