< Abụ Ọma 109 >
1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma Devid. O Chineke, onye m na-eto, anọgidekwala na-agba nkịtị,
Fún adarí orin. Ti Dafidi. Saamu. Ọlọ́run, ti èmi ń fi ìyìn fún, má ṣe dákẹ́,
2 nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ emegheela ọnụ ha megide m; ha aghaala ụgha megide m.
nítorí àwọn ènìyàn búburú àti ẹlẹ́tàn ti ya ẹnu wọn sí mi wọ́n ti fi ahọ́n èké sọ̀rọ̀ sí mi.
3 Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu; na-ebuso m agha nʼefu.
Wọ́n fi ọ̀rọ̀ ìríra yí mi káàkiri; wọ́n bá mi jà láìnídìí
4 Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo ma abụ m nwoke onye ekpere.
Nípò ìfẹ́ mi, wọn ń ṣe ọ̀tá mi, ṣùgbọ́n èmi ń gba àdúrà.
5 Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma m mere, ịkpọ asị nʼọnọdụ ịhụnanya.
Wọ́n sì fi ibi san ìre fún mi àti ìríra fún ìfẹ́ mi.
6 Họpụta otu onye ajọ omume ka o guzogide ya; ka onye na-ebo ebubo ụgha guzokwa nʼaka nri ya.
Yan àwọn ènìyàn búburú láti dojúkọ jẹ́ kí àwọn olùfisùn dúró ní ọwọ́ ọ̀tún rẹ̀.
7 Mgbe a ga-ekpe ya ikpe, ka ọ bụrụ onye ikpe mara, ka ekpere ya maa ya ikpe ọnwụ.
Kí a dá a lẹ́bi nígbà tí a bá ṣe ìdájọ́ kí àdúrà rẹ̀ kí ó lè di ìkọ̀sílẹ̀.
8 Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole, ka onye ọzọ nara ya ọkwa ya.
Kí ọjọ́ rẹ̀ kí ó kúrú; kí ẹlòmíràn kí ó rọ́pò iṣẹ́ rẹ̀.
9 Ka ụmụ ya ghọọ ndị na-enweghị nna, ka nwunye ya bụrụ nwanyị na-enweghị di.
Kí àwọn ọmọ rẹ̀ di aláìní baba kí aya rẹ̀ sì di opó.
10 Ka ụmụ ya ghọọ ndị arịrịọ na-enweghị ebe obibi, ndị e si na mkpọmkpọ ebe ha bi chụpụ.
Jẹ́ kí àwọn ọmọ rẹ̀ máa ṣagbe kiri kí wọn máa tọrọ oúnjẹ jìnnà sí ibi ahoro wọn.
11 Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere, ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya.
Jẹ́ kí alọ́nilọ́wọ́gbà kí ó mú ohun gbogbo tí ó ní jẹ́ kí àlejò kí o kó èrè iṣẹ́ rẹ̀ lọ.
12 Ka onye ọbụla ghara igosi ya obiọma; ka onye ọbụla gharakwa imere ụmụ ya ndị ọ hapụrụ ebere.
Má ṣe jẹ́ kí ẹnìkan ṣe àánú fún un tàbí kí wọn káàánú lórí àwọn ọmọ rẹ̀ aláìní baba.
13 Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa, ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu.
Kí a gé àrọ́mọdọ́mọ rẹ̀ kúrò kí orúkọ wọn kí ó parẹ́ ní ìran tí ń bọ̀.
14 Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha, ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya.
Kí ẹ̀ṣẹ̀ àwọn baba rẹ̀ kí ó wà ní ìrántí ní ọ̀dọ̀ Olúwa. Má ṣe jẹ́ kí a yọ ẹ̀ṣẹ̀ ìyá wọn kúrò.
15 Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile; ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile.
Jẹ́ kí ẹ̀ṣẹ̀ wọn kí ó wà ní ìrántí níwájú Olúwa kí ó lè gé ìrántí wọn kúrò lórí ilẹ̀.
16 Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere, ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ.
Nítorí kò rántí láti ṣàánú, ṣùgbọ́n ó ṣe inúnibíni sí ọkùnrin tálákà àti olùpọ́njú, kí ó lè pa oníròbìnújẹ́ ọkàn.
17 Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya, ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya; ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla, ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ.
Ó fẹ́ràn láti máa mú ègún wá sí orí rẹ̀: bi inú rẹ̀ kò ti dùn si ìre, bẹ́ẹ̀ ni kí ó jìnnà sí.
18 O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya; ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri, bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ.
Bí ó ti fi ègún wọ ará rẹ̀ láṣọ bí ẹ̀wù bẹ́ẹ̀ ni kí ó wá sí inú rẹ̀ bí omi.
19 Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa, dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi.
Jẹ́ kí ó rí fún un bí aṣọ tí a dà bò ó ní ara, àti fún àmùrè tí ó fi gba ọ̀já nígbà gbogbo.
20 Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata, bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m.
Èyí ni èrè àwọn ọ̀tá mi láti ọwọ́ Olúwa wá; àti ti àwọn tí ń sọ̀rọ̀ ibi sí ọkàn mi.
21 Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nyere m aka nʼihi aha gị, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m.
Ṣùgbọ́n ìwọ, ìwọ ṣe fún mi Olúwa Olódùmarè, ṣe rere fún mi nítorí orúkọ rẹ. Nítorí tí àánú rẹ dára, ìwọ gbà mí.
22 Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa, obi m tiwakwara etiwa nʼime m.
Nítorí pé tálákà àti aláìní ni mí, àyà mi sì gbọgbẹ́ nínú mi.
23 Ana m efu dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara; adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ.
Èmi ń kọjá lọ bí òjìji tí àṣálẹ́, mo ń gbọ̀n sókè bí eṣú.
24 Ike agwụla ikpere m, nʼihi ibu ọnụ; ataakwala m ahụ, bụrụ naanị ọkpụkpụ.
Eékún mi di aláìlera nítorí àwẹ̀ gbígbà ẹran-ara mi sì gbẹ nítorí àìlera mi.
25 Aghọọla m onye e ji eme ihe ọchị nye ndị na-ebo m ebubo, mgbe ha hụrụ m, ha na-efufe isi ha.
Mo dàbí ẹ̀gàn fún àwọn olùfisùn mi; nígbà tí wọn wò mí, wọ́n gbọn orí wọn.
26 Nyere m aka, o Onyenwe anyị Chineke m; zọpụta m dịka ịhụnanya gị si dị.
Ràn mí lọ́wọ́, Olúwa Ọlọ́run mi; gbà mí gẹ́gẹ́ bí ìṣeun ìfẹ́ rẹ.
27 Ka ha mara na ọ bụ aka gị, na ọ bụ gị, o Onyenwe anyị, mere ya.
Jẹ́ kí wọn mọ̀ pé ọwọ́ rẹ ni èyí wí pé ìwọ, Olúwa, ni ó ṣe é.
28 Ha nwere ike nọgide na-abụ ọnụ, ma ị ga-agọzi; mgbe ha ga-abịa ọgụ, a ga-eme ha ihe ihere, ma ohu gị ga-aṅụrị ọṅụ.
Wọ́n ó máa gégùn ún, ṣùgbọ́n ìwọ máa súre, nígbà tí wọn bá dìde kí ojú kí ó tì wọ́n, ṣùgbọ́n ìránṣẹ́ rẹ yóò yọ̀.
29 A ga-eji ihere yikwasị ndị na-ebo m ebubo dịka uwe werekwa ihere kee ha gburugburu dịka uwe mwụda.
Jẹ́ kí a wọ àwọn ọ̀tá mi ní aṣọ ìtìjú kí á sì fi ìdàrúdàpọ̀ bọ̀ wọ́n lára bí ẹ̀wù.
30 Aga m eji ọnụ m jaa Onyenwe anyị mma nke ukwuu; nʼetiti ọha mmadụ dị ukwuu, aga m eto ya.
Pẹ̀lú ẹnu mi èmi yóò máa yin Olúwa gidigidi ní àárín ọ̀pọ̀ ènìyàn èmi yóò máa yìn ín.
31 Nʼihi na ọ na-eguzo nʼaka nri nke onye nọ na mkpa, ịzọpụta ya site nʼaka ndị na-ama ya ikpe ọnwụ.
Nítorí ó dúró ní apá ọ̀tún aláìní láti gbà á lọ́wọ́ àwọn tí ń dá ọkàn rẹ̀ lẹ́bi.