< Abụ Ọma 109 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma Devid. O Chineke, onye m na-eto, anọgidekwala na-agba nkịtị,
In finem. Psalmus David.
2 nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ emegheela ọnụ ha megide m; ha aghaala ụgha megide m.
[Deus, laudem meam ne tacueris, quia os peccatoris et os dolosi super me apertum est.
3 Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu; na-ebuso m agha nʼefu.
Locuti sunt adversum me lingua dolosa, et sermonibus odii circumdederunt me: et expugnaverunt me gratis.
4 Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo ma abụ m nwoke onye ekpere.
Pro eo ut me diligerent, detrahebant mihi; ego autem orabam.
5 Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma m mere, ịkpọ asị nʼọnọdụ ịhụnanya.
Et posuerunt adversum me mala pro bonis, et odium pro dilectione mea.
6 Họpụta otu onye ajọ omume ka o guzogide ya; ka onye na-ebo ebubo ụgha guzokwa nʼaka nri ya.
Constitue super eum peccatorem, et diabolus stet a dextris ejus.
7 Mgbe a ga-ekpe ya ikpe, ka ọ bụrụ onye ikpe mara, ka ekpere ya maa ya ikpe ọnwụ.
Cum judicatur, exeat condemnatus; et oratio ejus fiat in peccatum.
8 Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole, ka onye ọzọ nara ya ọkwa ya.
Fiant dies ejus pauci, et episcopatum ejus accipiat alter.
9 Ka ụmụ ya ghọọ ndị na-enweghị nna, ka nwunye ya bụrụ nwanyị na-enweghị di.
Fiant filii ejus orphani, et uxor ejus vidua.
10 Ka ụmụ ya ghọọ ndị arịrịọ na-enweghị ebe obibi, ndị e si na mkpọmkpọ ebe ha bi chụpụ.
Nutantes transferantur filii ejus et mendicent, et ejiciantur de habitationibus suis.
11 Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere, ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya.
Scrutetur fœnerator omnem substantiam ejus, et diripiant alieni labores ejus.
12 Ka onye ọbụla ghara igosi ya obiọma; ka onye ọbụla gharakwa imere ụmụ ya ndị ọ hapụrụ ebere.
Non sit illi adjutor, nec sit qui misereatur pupillis ejus.
13 Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa, ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu.
Fiant nati ejus in interitum; in generatione una deleatur nomen ejus.
14 Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha, ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya.
In memoriam redeat iniquitas patrum ejus in conspectu Domini, et peccatum matris ejus non deleatur.
15 Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile; ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile.
Fiant contra Dominum semper, et dispereat de terra memoria eorum:
16 Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere, ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ.
pro eo quod non est recordatus facere misericordiam,
17 Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya, ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya; ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla, ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ.
et persecutus est hominem inopem et mendicum, et compunctum corde, mortificare.
18 O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya; ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri, bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ.
Et dilexit maledictionem, et veniet ei; et noluit benedictionem, et elongabitur ab eo. Et induit maledictionem sicut vestimentum; et intravit sicut aqua in interiora ejus, et sicut oleum in ossibus ejus.
19 Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa, dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi.
Fiat ei sicut vestimentum quo operitur, et sicut zona qua semper præcingitur.
20 Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata, bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m.
Hoc opus eorum qui detrahunt mihi apud Dominum, et qui loquuntur mala adversus animam meam.
21 Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nyere m aka nʼihi aha gị, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m.
Et tu, Domine, Domine, fac mecum propter nomen tuum, quia suavis est misericordia tua.
22 Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa, obi m tiwakwara etiwa nʼime m.
Libera me, quia egenus et pauper ego sum, et cor meum conturbatum est intra me.
23 Ana m efu dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara; adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ.
Sicut umbra cum declinat ablatus sum, et excussus sum sicut locustæ.
24 Ike agwụla ikpere m, nʼihi ibu ọnụ; ataakwala m ahụ, bụrụ naanị ọkpụkpụ.
Genua mea infirmata sunt a jejunio, et caro mea immutata est propter oleum.
25 Aghọọla m onye e ji eme ihe ọchị nye ndị na-ebo m ebubo, mgbe ha hụrụ m, ha na-efufe isi ha.
Et ego factus sum opprobrium illis; viderunt me, et moverunt capita sua.
26 Nyere m aka, o Onyenwe anyị Chineke m; zọpụta m dịka ịhụnanya gị si dị.
Adjuva me, Domine Deus meus; salvum me fac secundum misericordiam tuam.
27 Ka ha mara na ọ bụ aka gị, na ọ bụ gị, o Onyenwe anyị, mere ya.
Et sciant quia manus tua hæc, et tu, Domine, fecisti eam.
28 Ha nwere ike nọgide na-abụ ọnụ, ma ị ga-agọzi; mgbe ha ga-abịa ọgụ, a ga-eme ha ihe ihere, ma ohu gị ga-aṅụrị ọṅụ.
Maledicent illi, et tu benedices: qui insurgunt in me confundantur; servus autem tuus lætabitur.
29 A ga-eji ihere yikwasị ndị na-ebo m ebubo dịka uwe werekwa ihere kee ha gburugburu dịka uwe mwụda.
Induantur qui detrahunt mihi pudore, et operiantur sicut diploide confusione sua.
30 Aga m eji ọnụ m jaa Onyenwe anyị mma nke ukwuu; nʼetiti ọha mmadụ dị ukwuu, aga m eto ya.
Confitebor Domino nimis in ore meo, et in medio multorum laudabo eum:
31 Nʼihi na ọ na-eguzo nʼaka nri nke onye nọ na mkpa, ịzọpụta ya site nʼaka ndị na-ama ya ikpe ọnwụ.
quia astitit a dextris pauperis, ut salvam faceret a persequentibus animam meam.]

< Abụ Ọma 109 >