< Abụ Ọma 108 >

1 Abụ, Abụ Ọma Devid. Obi m dị njikere, o Chineke; aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.
A song. A psalm of David. God, I have complete confidence in you! My whole being sings praises to you!
2 Teta! Ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
Wake up, harp and lyre! I will wake up the dawn!
3 Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
I will thank you among the peoples, Lord, I will sing your praises among the nations.
4 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
For your trustworthy love reaches higher than the heavens, your faithfulness is higher than the clouds.
5 Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile, ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
God, your greatness is above the highest heavens; and your glory is over all the earth!
6 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
Rescue those you love! Answer us, and save us by your power!
7 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.
God has spoken from his Temple: “Triumphantly I divide up Shechem, and portion out the Valley of Succoth.
8 Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
Both Gilead and Manasseh belong to me. Ephraim is my helmet, and Judah is my scepter.
9 Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
I will treat Moab as my washbasin; I will place my sandal on Edom; I will shout in triumph over Philistia.”
10 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
Who will bring me into the fortified city? Who will lead me into Edom?
11 Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
Have you rejected us, God? Won't you go out with our armies?
12 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
Please give us help against our enemies, for human help is worthless.
13 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Our strength is in God, and he will crush our enemies.

< Abụ Ọma 108 >