< Abụ Ọma 107 >
1 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Give thanks to the Lord for his goodness for his kindness endures forever.
2 Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a, ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị,
Let this be the song of the ransomed, whom the Lord has redeemed from distress,
3 ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda.
gathering them from all lands, east, west, north, and south.
4 Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi.
In the wastes of the desert some wandered, finding no way to a city inhabited.
5 Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi.
Full of hunger and thirst, their spirit failed.
6 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha, ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile.
Then they cried to the Lord in their trouble, and he saved them from their distresses,
7 O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi.
guiding them straight on the way, till they reached an inhabited city.
8 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
Let them thank the Lord for his kindness, for his wonderful deeds for people;
9 nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.
for the thirsty he satisfies, and the hungry he fills with good things.
10 Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi, ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ,
Some sat in darkness and gloom prisoners in irons and misery,
11 nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu.
for rebelling against God’s word, and spurning the Most High’s counsel.
12 Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ, ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ.
Their heart was bowed with toil; there was no one to help when they stumbled.
13 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile.
Then they cried to the Lord in their trouble, and he saved them from their distresses.
14 O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta. O tijikwara agbụ ha niile.
Out of darkness and gloom he brought them, and burst their chains.
15 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
Let them praise the Lord for his kindness, for his wonderful deeds for people.
16 nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ.
For he shattered the gates of bronze, and broke bars of iron.
17 Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
Some were sick from their wicked ways, and suffering because of their sins.
18 Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ ha bịakwara ọnụ ụzọ ama ọnwụ nso.
All manner of food they hated; they had come to the gates of death.
19 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ahụ niile.
Then they cried to the Lord in their trouble, and he saved them from their distresses.
20 O zipụrụ okwu ọnụ ya, gwọọ ha; ọ napụtara ha site nʼili.
He sent his word and healed them, and delivered their life from the pit.
21 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
Let them praise the Lord for his kindness, for his wonderful deeds for people.
22 Ka ha chụọ aja ekele nye ya jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile.
Let them offer to him thankofferings, and with joy tell what things he has done.
23 Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri; ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri.
Some crossed the sea in ships, doing business in great waters.
24 Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri.
They have seen what the Lord can do, and his wonderful deeds on the deep.
25 Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo nke buliri ebili mmiri elu.
At his command rose a tempest, which lifted the waves on high.
26 Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile; nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri.
Up to heaven they went, down to the depths; their courage failed them.
27 Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke. Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a.
They staggered and reeled like drunkards; all their skills useless.
28 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile.
Then they cried to the Lord in their trouble, and he saved them from their distresses.
29 O mere ka oke ifufe dere duu; o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.
He stilled the storm to a whisper, and the waves of the sea were hushed.
30 Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ, o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo.
They were glad, because it was quiet; they were led to the haven they longed for.
31 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
Let them praise the Lord, for his kindness, for his wonderful deeds for people.
32 Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ ma tookwa ya na nzukọ ndị okenye.
Where the people assemble, extol him, and praise him in council of elders.
33 Ọ na-eme ka iyi ghọọ ọzara; na-emekwa ka ebe mmiri si asọpụta ghọọ ala kpọrọ nkụ.
He turns streams into a wilderness, springs of water into thirsty land,
34 Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara, nʼihi ajọ omume nke ndị bi nʼime ya.
fruitful land into a salt waste, because of the sin of the people.
35 Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ala nke ọdọ mmiri jupụtara mee ka ala akọrọ ghọọ isi iyi nke na-asọ asọ;
A desert he makes pools of water, a land of drought into springs of water.
36 ebe ahụ ka ọ kpọbatara ndị agụụ na-agụ ka ha biri, ebe ahụ ka ha wuru obodo ebe ha ga-ebi.
He settles the hungry therein, they establish a city to live in.
37 Ha ghara mkpụrụ nʼubi ha dị iche iche, kụọkwa ọtụtụ ubi vaịnị ndị mịrị mkpụrụ dị ukwuu;
They sow fields and plant vineyards, which furnish a fruitful yield.
38 ọ gọziri ha, ọnụọgụgụ ha bakwara ụba, o mekwara ka anụ ụlọ ha mụbaa.
By his blessing they multiply greatly, and he lets not their cattle decrease.
39 Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, ha bụ ndị e ji mkpagbu na ihe ndakwasị na iru ụjụ wedata nʼala;
Yet when they are bowed and diminished by oppression, misfortune, or sorrow,
40 onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya mere ka ha wagharịa nʼọzara, ebe ụzọ na-adịghị.
he pours contempt upon princes, and on trackless wastes leads them astray
41 Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha, mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ.
He lifts the poor out of misery, and makes families fruitful as flocks.
42 Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrị ọṅụ, ma ndị ajọ omume na-emechi ọnụ ha nọọ duu.
At this sight shall the upright be glad, and all wicked mouths shall be stopped.
43 Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a, ma tuleekwa ọrụ ịhụnanya Onyenwe anyị nke dị ukwuu.
Let those who are wise observe this, and consider the love of the Lord