< Abụ Ọma 106 >

1 Toonu Onyenwe anyị. Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Dumisani iNkosi! Ibongeni iNkosi ngoba ilungile, ngoba umusa wayo umi kuze kube nininini.
2 Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile?
Ngubani ongalandisa izenzo ezilamandla zeNkosi, azwakalise yonke indumiso yayo?
3 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.
Babusisiwe abagcina izahlulelo, owenza ukulunga ngaso sonke isikhathi.
4 O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha,
Ngikhumbule, Nkosi, ngothando olalo kubantu bakho; ngethekelele ngosindiso lwakho;
5 ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara, ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị sorokwa ihe nketa gị nye otuto.
ukuze ngibone okuhle kwabakhethiweyo bakho, ukuze ngithokoze entokozweni yesizwe sakho, ukuze ngizincome kanye lelifa lakho.
6 Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume.
Sonile kanye labobaba, senze okubi, senza ngenkohlakalo.
7 Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie.
Obaba eGibhithe kabaqedisisanga izimangaliso zakho; kabakhumbulanga ubunengi bezisa zakho; kodwa benza umvukela elwandle, eLwandle oluBomvu.
8 Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu.
Loba kunjalo wabakhulula ngenxa yebizo lakhe, ukuze azise amandla akhe.
9 Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa; o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara.
Wasekhuza uLwandle oluBomvu, lwatsha; wasebahambisa phakathi kwezinziki njengenkangala.
10 Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
Wasebasindisa esandleni somzondi, wabahlenga esandleni sesitha.
11 Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile; ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ.
Amanzi asibekela izitha zabo; kakusalanga loyedwa kuzo.
12 Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto.
Basebekholwa amazwi akhe, bahlabelela indumiso yakhe.
13 Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.
Baphanga bakhohlwa imisebenzi yakhe, kabalindelanga iseluleko sakhe.
14 Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.
Kodwa bakhanuka lokukhanuka ehlane, bamlinga uNkulunkulu enkangala.
15 Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya, ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha.
Wasebanika isicelo sabo, kodwa wathumela ukucaka emphefumulweni wabo.
16 Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.
Basebesiba lomhawu ngoMozisi enkambeni, ngoAroni ongcwele weNkosi.
17 Ala meghere loda Datan, o likwara Abiram, na ndị otù ya.
Umhlaba wavuleka waginya uDathani, wasibekela iqembu likaAbiramu.
18 Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.
Lomlilo wavutha eqenjini labo, ilangabi latshisa abakhohlakeleyo.
19 Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa.
Benza ithole eHorebe, bakhonza isithombe esibunjwe ngokuncibilikisa.
20 Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha.
Basebeguqula inkazimulo yabo yaba yisifaniso senkabi edla utshani.
21 Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt,
Bamkhohlwa uNkulunkulu umsindisi wabo, owayenze izinto ezinkulu eGibhithe,
22 ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie.
izimangaliso elizweni likaHamu; izinto ezesabekayo eLwandle oluBomvu.
23 Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.
Ngakho wathi uzababhubhisa, ngaphandle kokuthi uMozisi okhethiweyo wakhe wayemile ekufohleni phambi kwakhe ukuphendula ulaka lwakhe ukuze angababhubhisi.
24 Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya.
Yebo, baleyisa ilizwe elihle, kabalikholwanga ilizwi lakhe.
25 Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị.
Kodwa bakhonona emathenteni abo, kabalilalelanga ilizwi leNkosi.
26 Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara,
Ngakho waphakamisa isandla sakhe emelene labo, ukubawisa enkangala,
27 mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile.
lokuwisa inzalo yabo phakathi kwezizwe, lokubahlakaza emazweni.
28 Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;
Basebezihlanganisa loBhali-Peyori, badla imihlatshelo yabafileyo.
29 ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe, nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha.
Basebemthukuthelisa ngezenzo zabo, lenhlupheko yafohlela kibo.
30 Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi, ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
Kwasekusukuma uPhinehasi, wenza isigwebo, inhlupheko yasimiswa.
31 A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Lokhu kwasekubalelwa kuye kube yikulunga, esizukulwaneni ngesizukulwana kuze kube nininini.
32 Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis;
Basebemthukuthelisa emanzini empikisano, kwaze kwaba kubi kuMozisi ngenxa yabo.
33 nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu.
Ngoba bacunula umoya wakhe, waze wakhuluma ngamawala ngendebe zakhe.
34 Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.
Kabazibhubhisanga izizwe, iNkosi eyayibatshele ngazo.
35 Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme.
Kodwa bazihlanganisa lezizwe, bafunda imisebenzi yazo.
36 Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.
Basebekhonza izithombe zazo ezaba ngumjibila kubo.
37 Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja.
Lamadodana abo lamadodakazi abo bawahlabela amadimoni.
38 Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla, ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan, si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ.
Bachitha igazi elingelacala, igazi lamadodana abo lamadodakazi abo, abawahlabela izithombe zeKhanani; lelizwe langcoliswa ngegazi elinengi.
39 Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha.
Basebengcola ngemisebenzi yabo, baphinga ngezenzo zabo.
40 Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ.
Ngakho ulaka lweNkosi lwabavuthela abantu bayo, yanengwa yilifa layo.
41 Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.
Yabanikela esandleni sezizwe, lababazondayo bababusa.
42 Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.
Lezitha zabo zabacindezela, basebethotshiswa ngaphansi kwesandla sazo.
43 Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.
Yabakhulula kanengi; kodwa bona bayivukela ngecebo labo, behliswa ngobubi babo.
44 Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;
Loba kunjalo yabona ukuhlupheka kwabo, lapho isizwa ukukhala kwabo.
45 nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya, sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere.
Yabakhumbulela isivumelwano sayo, yazisola njengobunengi bezisa zayo.
46 Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha.
Yabanika izisa phambi kwabo bonke ababebathumbile.
47 O Onyenwe anyị Chineke anyị, zọpụta anyị, chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.
Sisindise, Nkosi Nkulunkulu wethu, usibuthe sivela ezizweni, ukubonga ibizo lakho elingcwele, ukuzincoma endumisweni yakho.
48 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Ka mmadụ niile sị, “Amen!” Toonu Onyenwe anyị.
Kayibongwe iNkosi, uNkulunkulu kaIsrayeli, kusukela phakade kuze kube sephakadeni! Abantu bonke kabathi: Ameni. Dumisani iNkosi!

< Abụ Ọma 106 >