< Abụ Ọma 106 >

1 Toonu Onyenwe anyị. Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Hallelujah! Give thanks to the Lord for his goodness, for his kindness endures forever.
2 Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile?
Who can describe his heroic deeds, or publish all his praise?
3 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.
Happy they who act justly, and do righteousness evermore.
4 O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha,
Remember me, Lord, as you remember your people, and visit me with your gracious help.
5 ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara, ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị sorokwa ihe nketa gị nye otuto.
May I see the good fortune of your elect, may I share in the joy of your nation, and in the pride of your heritage.
6 Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume.
We, like our fathers, have sinned, we have done perversely and wickedly
7 Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie.
In the land of Egypt our fathers, all heedless of your wonders, and unmindful of your great kindness, at the Red Sea defied the Most High.
8 Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu.
But true to his name he saved them, in order to show his might.
9 Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa; o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara.
He rebuked the Red Sea, and it dried; they marched through the depths as through desert,
10 Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
saved from the hand of the hostile, redeemed from the hand of the foe.
11 Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile; ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ.
The waters covered their enemies: not one of them was left.
12 Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto.
So then they believed in his words, and began to sing his praise.
13 Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.
But soon they forgot his deeds: they did not wait for his counsel.
14 Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.
Their greed was ravenous in the desert; they put God to the test in the wilderness.
15 Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya, ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha.
He gave them the thing they had asked for, but sent wasting disease among them.
16 Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.
The camp grew jealous of Moses and of Aaron, holy one of the Lord.
17 Ala meghere loda Datan, o likwara Abiram, na ndị otù ya.
The earth opened and swallowed up Dathan, and covered Abiram’s company.
18 Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.
Fire broke out on their company, flame kindled upon the wicked.
19 Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa.
They made a calf in Horeb, and bowed to the molten image.
20 Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha.
They exchanged their glorious God for the image of ox that eats grass.
21 Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt,
They forgot the God who had saved them by mighty deeds in Egypt
22 ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie.
Wonders in the land of Ham, terrors by the Red Sea.
23 Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.
So he vowed, and would have destroyed them, but for Moses his elect, who stepped into the breach before him, to divert his deadly wrath.
24 Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya.
They spurned the delightsome land, they refused to believe in his word.
25 Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị.
They grumbled in their tents, would not listen to the voice of the Lord.
26 Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara,
So he swore with uplifted hand to lay them low in the wilderness;
27 mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile.
to disperse their seed among heathen, to scatter them over the world.
28 Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;
Then they joined them to Baal of Peor, and ate what was offered the dead.
29 ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe, nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha.
They provoked him to wrath by their deeds, and plague broke out among them.
30 Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi, ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
Then Phinehas stood between, and so the plague was stayed;
31 A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
and it was counted to him for righteousness unto all generations forever.
32 Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis;
They angered him at the waters of Meribah, through them it went ill with Moses.
33 nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu.
They rebelled against his spirit, and he uttered speech that was rash.
34 Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.
They did not destroy the nations, as the Lord had commanded them;
35 Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme.
but they mingled with the heathen, and learned to do as they did.
36 Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.
Their idol gods they worshipped, and they were ensnared by them.
37 Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja.
They sacrificed their sons and their daughters to the demons.
38 Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla, ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan, si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ.
They poured out innocent blood the blood of their sons and daughters whom they offered to Canaan’s idols, and the land was polluted with blood.
39 Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha.
They became unclean by their works, and adulterous in their deeds.
40 Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ.
Then the Lord’s fury was on his people, filled with horror at his inheritance.
41 Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.
He delivered them to the heathen, to the sway of those who hated them.
42 Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.
Their enemies oppressed them, and subdued them under their hand.
43 Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.
Many a time he saved them, but they rebelled at his counsel, and were brought low by their wrongdoing.
44 Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;
Yet he looked upon their distress, when he heard their cry.
45 nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya, sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere.
He remembered his covenant, and, in his great kindness, relented.
46 Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha.
He caused them to be pitied by all who carried them captive.
47 O Onyenwe anyị Chineke anyị, zọpụta anyị, chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.
Save us, O Lord our God, and gather us out of the nations, to give thanks to your holy name, and to make our boast of your praise.
48 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Ka mmadụ niile sị, “Amen!” Toonu Onyenwe anyị.
Blessed be the Lord, the God of Israel, from everlasting to everlasting. And let all the people say ‘Amen.’ Praise the Lord.

< Abụ Ọma 106 >