< Abụ Ọma 105 >
1 Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
Mshukuruni Bwana, liitieni jina lake, wajulisheni mataifa yale aliyoyatenda.
2 Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile.
Mwimbieni yeye, mwimbieni yeye sifa, waambieni matendo yake yote ya ajabu.
3 Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa.
Lishangilieni jina lake takatifu, mioyo ya wale wamtafutao Bwana na ifurahi.
4 Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
Mtafuteni Bwana na nguvu zake, utafuteni uso wake siku zote.
5 Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta,
Kumbuka matendo ya ajabu aliyoyafanya, miujiza yake na hukumu alizozitamka,
6 unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
enyi wazao wa Abrahamu mtumishi wake, enyi wana wa Yakobo, wateule wake.
7 Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.
Yeye ndiye Bwana Mungu wetu, hukumu zake zimo duniani pote.
8 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ,
Hulikumbuka agano lake milele, neno ambalo aliamuru, kwa vizazi elfu,
9 ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
agano alilolifanya na Abrahamu, kiapo alichomwapia Isaki.
10 O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
Alilithibitisha kwa Yakobo kuwa amri, kwa Israeli liwe agano la milele:
11 “Aga m enye gị ala Kenan dịka oke i ga-eketa.”
“Nitakupa wewe nchi ya Kanaani kuwa sehemu utakayoirithi.”
12 Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya.
Walipokuwa wachache kwa idadi, wachache sana na wageni ndani yake,
13 Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ.
walitangatanga kutoka taifa moja hadi jingine, kutoka ufalme mmoja hadi mwingine.
14 O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha;
Hakuruhusu mtu yeyote awaonee; kwa ajili yao aliwakemea wafalme, akisema:
15 sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka; unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
“Msiwaguse niliowatia mafuta; msiwadhuru manabii wangu.”
16 O zitere ụnwụ nʼala ahụ, bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri;
Akaiita njaa juu ya nchi na kuharibu chakula chao chote,
17 o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha, Josef, onye e refuru dịka ohu.
naye akatuma mtu mbele yao, Yosefu, aliyeuzwa kama mtumwa.
18 Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ, nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu,
Walichubua miguu yake kwa minyororo, shingo yake ilifungwa kwa chuma,
19 tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu.
hadi yale aliyotangulia kusema yalipotimia, hadi neno la Bwana lilipomthibitisha.
20 Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya.
Mfalme alituma watu wakamfungua, mtawala wa watu alimwachia huru.
21 O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere,
Alimfanya mkuu wa nyumba yake, mtawala juu ya vyote alivyokuwa navyo,
22 ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya, na izi ndị okenye ya amamihe.
kuwaelekeza wakuu wa mfalme apendavyo na kuwafundisha wazee wake hekima.
23 Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.
Kisha Israeli akaingia Misri, Yakobo akaishi kama mgeni katika nchi ya Hamu.
24 Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha,
Bwana aliwafanya watu wake kuzaana sana, akawafanya kuwa wengi sana kuliko adui zao,
25 ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.
ndiye aliigeuza mioyo yao iwachukie watu wake, wakatenda hila dhidi ya watumishi wake.
26 O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara.
Akamtuma Mose mtumishi wake, pamoja na Aroni, aliyemchagua.
27 Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.
Walifanya ishara zake za ajabu miongoni mwao, miujiza yake katika nchi ya Hamu.
28 O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya.
Alituma giza na nchi ikajaa giza, kwani si walikuwa wameyaasi maneno yake?
29 O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara, nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa.
Aligeuza maji yao kuwa damu, ikasababisha samaki wao kufa.
30 Ala ha niile jupụtara nʼawọ ọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị.
Nchi yao ilijaa vyura tele, ambao waliingia hadi kwenye vyumba vya kulala vya watawala wao.
31 O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta dị iche iche ejupụta nʼala ha niile.
Alisema, yakaja makundi ya mainzi, na viroboto katika nchi yao yote.
32 Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile;
Alibadilisha mvua yao ikawa mvua ya mawe, yenye umeme wa radi nchini yao yote,
33 o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha, kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha.
akaharibu mizabibu yao na miti ya tini, na akaangamiza miti ya nchi yao.
34 O kwuru okwu, igurube na ụkpana a na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile;
Alisema, nzige wakaja, tunutu wasio na idadi,
35 ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ, ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha.
wakala kila jani katika nchi yao, wakala mazao ya ardhi yao.
36 Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.
Kisha akawaua wazaliwa wote wa kwanza katika nchi yao, matunda ya kwanza ya ujana wao wote.
37 Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo, ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike.
Akawatoa Israeli katika nchi wakiwa na fedha na dhahabu nyingi, wala hakuna hata mmoja kutoka kabila zao aliyejikwaa.
38 Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ, nʼihi na oke egwu ndị Izrel dakwasịrị ha.
Misri ilifurahi walipoondoka, kwa sababu hofu ya Israeli ilikuwa imewaangukia.
39 Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi, na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.
Alitandaza wingu kama kifuniko, na moto kuwamulikia usiku.
40 Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel, jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.
Waliomba, naye akawaletea kware, akawashibisha kwa mkate wa mbinguni.
41 O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara; ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.
Alipasua mwamba, maji yakabubujika, yakatiririka jangwani kama mto.
42 Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ, nke o kwere ohu ya Ebraham.
Kwa maana alikumbuka ahadi yake takatifu, aliyompa Abrahamu mtumishi wake.
43 O ji aṅụrị dupụta ndị ya, jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;
Aliwatoa watu wake kwa furaha, wateule wake kwa kelele za shangwe,
44 o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche, ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta,
akawapa nchi za mataifa, wakawa warithi wa mali wengine walikuwa wameitaabikia:
45 ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niile ma na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị.
alifanya haya ili wayashike mausia yake na kuzitii sheria zake. Msifuni Bwana.