< Abụ Ọma 104 >

1 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe.
わがたましいよ、主をほめよ。わが神、主よ、あなたはいとも大いにして誉と威厳とを着、
2 Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa; ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu
光を衣のようにまとい、天を幕のように張り、
3 na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri. Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.
水の上におのが高殿のうつばりをおき、雲をおのれのいくさ車とし、風の翼に乗りあるき、
4 O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi, meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.
風をおのれの使者とし、火と炎をおのれのしもべとされる。
5 Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa; agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.
あなたは地をその基の上にすえて、とこしえに動くことのないようにされた。
6 I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, mmiri tokpukwara ugwu niile.
あなたはこれを衣でおおうように大水でおおわれた。水はたたえて山々の上を越えた。
7 Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ, nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.
あなたのとがめによって水は退き、あなたの雷の声によって水は逃げ去った。
8 Ha sitere nʼelu ugwu niile, sọrọ gaa na ndagwurugwu, ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.
山は立ちあがり、谷はあなたが定められた所に沈んだ。
9 Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe, gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.
あなたは水に境を定めて、これを越えさせず、再び地をおおうことのないようにされた。
10 Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu, meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.
あなたは泉を谷にわき出させ、それを山々の間に流れさせ、
11 Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ.
野のもろもろの獣に飲ませられる。野のろばもそのかわきをいやす。
12 Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha; nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ.
空の鳥もそのほとりに住み、こずえの間にさえずり歌う。
13 Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile; ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya.
あなたはその高殿からもろもろの山に水を注がれる。地はあなたのみわざの実をもって満たされる。
14 Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, ime ka nri site nʼala pupụta;
あなたは家畜のために草をはえさせ、また人のためにその栽培する植物を与えて、地から食物を出させられる。
15 mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị, mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma, na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
すなわち人の心を喜ばすぶどう酒、その顔をつややかにする油、人の心を強くするパンなどである。
16 A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma, osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.
主の木と、主がお植えになったレバノンの香柏とは豊かに潤され、
17 Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha; nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.
鳥はその中に巣をつくり、こうのとりはもみの木をそのすまいとする。
18 Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa; nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.
高き山はやぎのすまい、岩は岩だぬきの隠れる所である。
19 I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche; anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.
あなたは月を造って季節を定められた。日はその入る時を知っている。
20 Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị; ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.
あなたは暗やみを造って夜とされた。その時、林の獣は皆忍び出る。
21 Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu, ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.
若きししはほえてえさを求め、神に食物を求める。
22 Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara, ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.
日が出ると退いて、その穴に寝る。
23 Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ, kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.
人は出てわざにつき、その勤労は夕べに及ぶ。
24 Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.
主よ、あなたのみわざはいかに多いことであろう。あなたはこれらをみな知恵をもって造られた。地はあなたの造られたもので満ちている。
25 Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.
かしこに大いなる広い海がある。その中に無数のもの、大小の生き物が満ちている。
26 Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị, nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.
そこに舟が走り、あなたが造られたレビヤタンはその中に戯れる。
27 Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.
彼らは皆あなたが時にしたがって食物をお与えになるのを期待している。
28 Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma.
あなたがお与えになると、彼らはそれを集める。あなたが手を開かれると、彼らは良い物で満たされる。
29 Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.
あなたがみ顔を隠されると、彼らはあわてふためく。あなたが彼らの息を取り去られると、彼らは死んでちりに帰る。
30 Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.
あなたが霊を送られると、彼らは造られる。あなたは地のおもてを新たにされる。
31 Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi; ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,
どうか、主の栄光がとこしえにあるように。主がそのみわざを喜ばれるように。
32 onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji, onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.
主が地を見られると、地は震い、山に触れられると、煙をいだす。
33 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m; aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.
わたしは生きるかぎり、主にむかって歌い、ながらえる間はわが神をほめ歌おう。
34 Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ, dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
どうか、わたしの思いが主に喜ばれるように。わたしは主によって喜ぶ。
35 Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa. Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m! Toonu Onyenwe anyị!
どうか、罪びとが地から断ち滅ぼされ、悪しき者が、もはや、いなくなるように。わがたましいよ、主をほめよ。主をほめたたえよ。

< Abụ Ọma 104 >