< Abụ Ọma 104 >
1 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe.
Yabi Ubangiji, ya raina. Ya Ubangiji Allahna, kana da girma ƙwarai; kana saye da daraja da ɗaukaka.
2 Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa; ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu
Ubangiji ya naɗe kansa da haske kamar riga ya shimfiɗa sammai kamar tenti
3 na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri. Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.
ya kafa ginshiƙan ɗakin samansa a kan ruwaye. Ya maido da gizagizai suka zama keken yaƙinsa yana hawa a kan fikafikan iska.
4 O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi, meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.
Ya mai da iska suka zama’yan saƙonsa harsunan wuta kuma bayinsa.
5 Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa; agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.
Ya kafa duniya a kan tussanta; ba za a iya matsar da ita ba.
6 I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, mmiri tokpukwara ugwu niile.
Ka rufe ta da zurfi kamar da riga ruwaye sun tsaya a bisa duwatsu.
7 Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ, nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.
Amma a tsawatawarka ruwaye suka gudu da jin ƙarar tsawanka suka ruga da gudu;
8 Ha sitere nʼelu ugwu niile, sọrọ gaa na ndagwurugwu, ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.
suka gudu a bisa duwatsu, suka gangara zuwa cikin kwaruruka, zuwa wurin da ka shirya musu.
9 Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe, gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.
Ka kafa iyakar da ba a iya tsallakawa; ba za su ƙara rufe duniya ba.
10 Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu, meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.
Ya sa maɓulɓulai suka zuba ruwa cikin kwaruruka; yana gudu tsakanin duwatsu.
11 Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ.
Suna ba da ruwa ga dukan namun jeji; jakunan jeji suna kashe ƙishirwansu.
12 Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha; nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ.
Tsuntsaye sarari suna sheƙunansu kusa da ruwan; suna rera cikin rassa.
13 Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile; ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya.
Yana wa duwatsu banruwa daga ɗakinsa na sama; ƙasa tana ƙoshiya da amfanin aikinsa.
14 Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, ime ka nri site nʼala pupụta;
Yana sa ciyawa tă yi girma saboda shanu, tsire-tsire domin mutum ya nome, suna fid da abinci daga ƙasa,
15 mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị, mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma, na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
ruwan inabi yakan sa zuciyar mutum tă yi murna, mai kuwa yakan sa fuska tă yi haske, abinci kuma da yake riƙe zuciyarsa.
16 A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma, osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.
Ana yi wa itatuwan Ubangiji banruwa sosai, al’ul na Lebanon da ya shuka.
17 Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha; nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.
A can tsuntsaye suke sheƙunnansu; shamuwa tana da gidanta a itatuwan fir.
18 Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa; nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.
Manyan duwatsu na awakin jeji ne; tsagaggun duwatsun mafaka ne ga rema.
19 I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche; anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.
Wata ne ke ƙididdigar lokuta, rana kuma ta san sa’ad da za tă fāɗi.
20 Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị; ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.
Ka yi duhu, sai ya zama dare, sai dukan namun jeji a kurmi suka fito a maƙe.
21 Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu, ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.
Zakoki sun yi ruri sa’ad da suke farauta suna kuma neman abincinsu daga Allah.
22 Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara, ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.
Rana ta fito, sai suka koma shiru; suka koma suka kwanta a kogwanninsu.
23 Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ, kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.
Mutum yakan tafi aikinsa, zuwa wurin aikinsa har yamma.
24 Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.
Ina misalin yawan aikinka, ya Ubangiji! Cikin hikima ka yi su duka; duniya ta cika da halittunka.
25 Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.
Akwai teku, babba da kuma fāɗi, cike da halittun da suka wuce ƙirga, abubuwa masu rai babba da ƙarami.
26 Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị, nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.
A can jiragen ruwa suna kai komo, kuma dodon ruwan da ka yi, yă yi wasa a can.
27 Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.
Waɗannan duka suna dogara gare ka don ka ba su abincinsu a daidai lokaci.
28 Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma.
Sa’ad da ba su da shi, sai su tattara shi; sa’ad da ka buɗe hannunka, sukan ƙoshi da abubuwa masu kyau.
29 Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.
Sa’ad da ka ɓoye fuskarka, sai su razana; sa’ad da ka ɗauke numfashinsu, sai su mutu su kuma koma ga ƙura.
30 Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.
Sa’ad da ka aika da Ruhunka, sai su halittu, su kuma sabunta fuskar duniya.
31 Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi; ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,
Bari ɗaukakar Ubangiji ta dawwama har abada; bari Ubangiji yă yi farin ciki cikin aikinsa,
32 onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji, onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.
shi wanda ya dubi duniya, sai ta razana, wanda ya taɓa duwatsu, sai suka yi hayaƙi.
33 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m; aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.
Zan rera ga Ubangiji dukan raina; zan rera yabo ga Allahna muddin ina raye.
34 Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ, dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
Bari tunanina yă gamshe shi, yayinda nake farin ciki a cikin Ubangiji.
35 Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa. Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m! Toonu Onyenwe anyị!
Amma bari masu zunubi su ɓace daga duniya mugaye kuma kada a ƙara ganinsu. Yabi Ubangiji, ya raina. Yabi Ubangiji.