< Abụ Ọma 103 >

1 Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.
לדוד ברכי נפשי את יהוה וכל קרבי את שם קדשו׃
2 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile,
ברכי נפשי את יהוה ואל תשכחי כל גמוליו׃
3 ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,
הסלח לכל עונכי הרפא לכל תחלאיכי׃
4 onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,
הגואל משחת חייכי המעטרכי חסד ורחמים׃
5 onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.
המשביע בטוב עדיך תתחדש כנשר נעוריכי׃
6 Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.
עשה צדקות יהוה ומשפטים לכל עשוקים׃
7 O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:
יודיע דרכיו למשה לבני ישראל עלילותיו׃
8 Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.
רחום וחנון יהוה ארך אפים ורב חסד׃
9 Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;
לא לנצח יריב ולא לעולם יטור׃
10 ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.
לא כחטאינו עשה לנו ולא כעונתינו גמל עלינו׃
11 Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.
כי כגבה שמים על הארץ גבר חסדו על יראיו׃
12 Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
כרחק מזרח ממערב הרחיק ממנו את פשעינו׃
13 Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
כרחם אב על בנים רחם יהוה על יראיו׃
14 nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja.
כי הוא ידע יצרנו זכור כי עפר אנחנו׃
15 Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,
אנוש כחציר ימיו כציץ השדה כן יציץ׃
16 ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.
כי רוח עברה בו ואיננו ולא יכירנו עוד מקומו׃
17 Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
וחסד יהוה מעולם ועד עולם על יראיו וצדקתו לבני בנים׃
18 nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
לשמרי בריתו ולזכרי פקדיו לעשותם׃
19 Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achị ihe niile.
יהוה בשמים הכין כסאו ומלכותו בכל משלה׃
20 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, na-erubere okwu ya isi.
ברכו יהוה מלאכיו גברי כח עשי דברו לשמע בקול דברו׃
21 Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya.
ברכו יהוה כל צבאיו משרתיו עשי רצונו׃
22 Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile nʼebe ọbụla ọ na-achị. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
ברכו יהוה כל מעשיו בכל מקמות ממשלתו ברכי נפשי את יהוה׃

< Abụ Ọma 103 >