< Abụ Ọma 102 >

1 Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị. Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.
Nkosi, zwana umkhuleko wami, lokukhala kwami kakuze kuwe.
2 Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa.
Ungangifihleli ubuso bakho osukwini lohlupho lwami; beka indlebe yakho kimi; mhla ngibiza ungiphendule masinyane.
3 Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.
Ngoba insuku zami ziyanyamalala njengentuthu, lamathambo ami ayatsha njengeziko.
4 Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; ana m echefu iri nri m.
Inhliziyo yami itshayiwe, yabuna njengotshani, ngaze ngakhohlwa ukudla isinkwa sami.
5 Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.
Ngenxa yelizwi lokububula kwami amathambo ami anamathela esikhumbeni sami.
6 Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.
Ngifanana lewunkwe yenkangala, senginjengesikhova sezindawo ezidilikileyo.
7 Ana m amụ anya abalị niile; adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.
Ngiyalinda, senginjengenyoni ehlezi yodwa ephahleni.
8 Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.
Izitha zami ziyangithuka usuku lonke; abangihlanyelayo bafunga ngami.
9 Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m
Ngoba ngidle umlotha njengesinkwa, ngixubanise okunathwayo kwami lezinyembezi,
10 nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.
ngenxa yentukuthelo yakho lolaka lwakho; ngoba ungiphakamisile, wasungilahla phansi.
11 Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.
Insuku zami zinjengesithunzi eselulekayo, njalo mina ngiyabuna njengotshani.
12 Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Kodwa wena, Nkosi, uzahlala kuze kube nininini, lesikhumbuzo sakho kusizukulwana lesizukulwana.
13 Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola.
Wena uzavuka uhawukele iZiyoni; ngoba isikhathi sokuyitshengisa umusa, yebo, isikhathi esimisiweyo sesifikile.
14 Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.
Ngoba inceku zakho ziyawathanda amatshe ayo, zilesihawu ethulini lwayo.
15 Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.
Khona izizwe zizalesaba ibizo leNkosi, lamakhosi wonke omhlaba udumo lwayo.
16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.
Lapho iNkosi izayakha iZiyoni, izabonakala enkazimulweni yayo.
17 Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.
Izaphendukela emkhulekweni wongelalutho, kayiyikudelela umthandazo wabo.
18 Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:
Lokhu kuzabhalelwa isizukulwana esilandelayo, labantu abazadalwa bazadumisa iNkosi.
19 “Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,
Ngoba yakhangela phansi isekuphakameni kwendawo yayo engcwele; iNkosi isemazulwini yakhangela emhlabeni,
20 ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”
ukuzwa ukububula kwesibotshwa, ukukhulula abamiselwa ukufa;
21 Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem,
ukulandisa ibizo leNkosi eZiyoni, lendumiso yayo eJerusalema,
22 mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.
lapho izizwe zibuthana ndawonye, lemibuso, ukuyikhonza iNkosi.
23 O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.
Yathoba amandla ami endleleni, yafinyeza insuku zami.
24 Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Ngathi: Nkulunkulu wami, ungangisusi phakathi kwensuku zami, iminyaka yakho isesizukulwaneni lezizukulwana.
25 Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
Endulo wawusekela umhlaba, lamazulu angumsebenzi wezandla zakho.
26 Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.
Lokho kuzabhubha, kodwa wena uzakuma. Kuzaguga-ke konke njengesembatho, njengesigqoko uzakuguqula, njalo kuzaguqulwa.
27 Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.
Kodwa wena unguwe njalo, leminyaka yakho kayipheli.
28 Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”
Abantwana benceku zakho bazahlala, lenzalo yazo izaqiniswa phambi kwakho.

< Abụ Ọma 102 >