< Abụ Ọma 102 >
1 Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị. Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.
A prayer of one who is afflicted, when he grows faint and pours out his lament before the LORD. Hear my prayer, O LORD; let my cry for help come before You.
2 Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa.
Do not hide Your face from me in my day of distress. Incline Your ear to me; answer me quickly when I call.
3 Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.
For my days vanish like smoke, and my bones burn like glowing embers.
4 Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; ana m echefu iri nri m.
My heart is afflicted, and withered like grass; I even forget to eat my bread.
5 Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.
Through my loud groaning my flesh clings to my bones.
6 Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.
I am like a desert owl, like an owl among the ruins.
7 Ana m amụ anya abalị niile; adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.
I lie awake; I am like a lone bird on a housetop.
8 Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.
All day long my enemies taunt me; they ridicule me and curse me.
9 Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m
For I have eaten ashes like bread and mixed my drink with tears
10 nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.
because of Your indignation and wrath, for You have picked me up and cast me aside.
11 Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.
My days are like lengthening shadows, and I wither away like grass.
12 Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
But You, O LORD, sit enthroned forever; Your renown endures to all generations.
13 Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola.
You will rise up and have compassion on Zion, for it is time to show her favor— the appointed time has come.
14 Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.
For Your servants delight in her stones and take pity on her dust.
15 Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.
So the nations will fear the name of the LORD, and all the kings of the earth will fear Your glory.
16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.
For the LORD will rebuild Zion; He has appeared in His glory.
17 Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.
He will turn toward the prayer of the destitute; He will not despise their prayer.
18 Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:
Let this be written for the generation to come, so that a people not yet created may praise the LORD.
19 “Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,
For He looked down from the heights of His sanctuary; the LORD gazed out from heaven to earth
20 ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”
to hear a prisoner’s groaning, to release those condemned to death,
21 Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem,
that they may proclaim the name of the LORD in Zion and praise Him in Jerusalem,
22 mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.
when peoples and kingdoms assemble to serve the LORD.
23 O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.
He has broken my strength on the way; He has cut short my days.
24 Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
I say: “O my God, do not take me in the midst of my days! Your years go on through all generations.
25 Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
In the beginning You laid the foundations of the earth, and the heavens are the work of Your hands.
26 Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.
They will perish, but You remain; they will all wear out like a garment. Like clothing You will change them, and they will be passed on.
27 Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.
But You remain the same, and Your years will never end.
28 Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”
The children of Your servants will dwell securely, and their descendants will be established before You.”