< Abụ Ọma 101 >

1 Abụ Ọma Devid. Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi; o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.
Ti Dafidi. Saamu. Èmi yóò kọrin ìfẹ́ àti òdodo; sí ọ Olúwa, èmi yóò máa kọrin ìyìn.
2 Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla, olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla jegharịa nʼime ụlọ m.
Èmi yóò máa rin ìrìn mi pẹ̀lú ọgbọ́n láìlẹ́ṣẹ̀, ìgbà wo ni ìwọ yóò wá sí ọ̀dọ̀ mi? Èmi yóò máa rìn ní ilé mi pẹ̀lú àyà pípé.
3 Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.
Èmi kì yóò gbé ohun búburú sí iwájú mi: iṣẹ́ àwọn tí ó yapa ni èmi kórìíra. Wọn kì yóò rọ̀ mọ́ mi.
4 Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.
Agídí ọkàn yóò kúrò lọ́dọ̀ mi; èmi kì yóò mọ ènìyàn búburú.
5 Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.
Ẹnikẹ́ni tí ó bá ń sọ̀rọ̀ ẹnìkejì rẹ̀ ní ìkọ̀kọ̀, òun ní èmi yóò gé kúrò ẹni tí ó bá gbé ojú rẹ̀ ga tí ó sì ní ìgbéraga àyà, òun ní èmi kì yóò faradà fún.
6 Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya, ka mụ na ha biri; onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla ga-ejere m ozi.
Ojú mi yóò wà lára àwọn olóòtítọ́ lórí ilẹ̀, kí wọn kí ó lè máa bá mi gbé; ẹni tí ó bá n rin ọ̀nà pípé òun ni yóò máa sìn mí.
7 Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ agaghị ebi nʼụlọ m; onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzokwa nʼihu m.
Ẹni tí ó bá ń ṣe ẹ̀tàn, kì yóò gbé ilé mi, kò sí ẹni tí ń ṣèké tí yóò dúró ní iwájú mi.
8 Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a; Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe site nʼobodo Onyenwe anyị.
Ní ojoojúmọ́ ní èmi yóò wá máa pa a lẹ́nu mọ gbogbo àwọn ènìyàn búburú ilẹ̀ náà; èmi yóò gé àwọn olùṣe búburú kúrò ní ìlú Olúwa.

< Abụ Ọma 101 >