< Abụ Ọma 100 >
1 Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.
Salimo. Nyimbo yothokoza. Fuwulani kwa Yehova mwachimwemwe, inu dziko lonse lapansi.
2 Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya
Mulambireni Yehova mosangalala; bwerani pamaso pake ndi nyimbo zachikondwerero.
3 Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.
Dziwani kuti Yehova ndi Mulungu. Iye ndiye amene anatipanga ndipo ife ndife ake; ndife anthu ake, nkhosa za pabusa pake.
4 Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya.
Lowani ku zipata zake ndi chiyamiko ndi ku mabwalo ake ndi matamando; muyamikeni ndi kutamanda dzina lake.
5 Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
Pakuti Yehova ndi wabwino ndipo chikondi chake ndi chamuyaya; kukhulupirika kwake nʼkokhazikika pa mibado ndi mibado.