< Ilu 1 >

1 Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.
THE PROVERBS of Solomon the son of David, king of Israel;
2 Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka, maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,
To know wisdom and instruction; to comprehend the words of understanding;
3 nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.
To receive the discipline of wisdom, justice, and right, and equity;
4 Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
To give prudence to the simple, to the young man knowledge and discretion;
5 Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
That the wise man may hear, and increase in learning, and the man of understanding may attain unto wise counsels;
6 Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.
To understand a proverb, and a figure; the words of the wise, and their dark sayings.
7 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
The fear of the LORD is the beginning of knowledge; but the foolish despise wisdom and discipline.
8 Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
Hear, my son, the instruction of thy father, and forsake not the teaching of thy mother;
9 Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
For they shall be a chaplet of grace unto thy head, and chains about thy neck.
10 Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra, ekwenyerela ha, Ekwela!
My son, if sinners entice thee, consent thou not.
11 Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.
If they say: 'Come with us, let us lie in wait for blood, let us lurk for the innocent without cause;
12 Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu. (Sheol h7585)
Let us swallow them up alive as the grave, and whole, as those that go down into the pit; (Sheol h7585)
13 Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa, nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị.
We shall find all precious substance, we shall fill our houses with spoil;
14 Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị, ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.”
Cast in thy lot among us; let us all have one purse' —
15 Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a, a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha;
My son, walk not thou in the way with them, restrain thy foot from their path;
16 nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.
For their feet run to evil, and they make haste to shed blood.
17 Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ, nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya.
For in vain the net is spread in the eyes of any bird;
18 Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.
And these lie in wait for their own blood, they lurk for their own lives.
19 Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.
So are the ways of every one that is greedy of gain; it taketh away the life of the owners thereof.
20 Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama.
Wisdom crieth aloud in the streets, she uttereth her voice in the broad places;
21 Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku, nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.
She calleth at the head of the noisy streets, at the entrances of the gates, in the city, she uttereth her words:
22 “Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?
'How long, ye thoughtless, will ye love thoughtlessness? And how long will scorners delight them in scorning, and fools hate knowledge?
23 Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu, aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu, aga m emekwa ka unu mara okwu m.
Turn you at my reproof; behold, I will pour out my spirit unto you, I will make known my words unto you.
24 Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,
Because I have called, and ye refused, I have stretched out my hand, and no man attended,
25 ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,
But ye have set at nought all my counsel, and would none of my reproof;
26 ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
I also, in your calamity, will laugh, I will mock when your dread cometh;
27 Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.
When your dread cometh as a storm, and your calamity cometh on as a whirlwind; when trouble and distress come upon you.
28 “Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
Then will they call me, but I will not answer, they will seek me earnestly, but they shall not find me.
29 Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị, unu atụghị egwu Onyenwe anyị.
For that they hated knowledge, and did not choose the fear of the LORD;
30 Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m. Unu lelịrị ịba mba m anya.
They would none of my counsel, they despised all my reproof.
31 Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta. Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.
Therefore shall they eat of the fruit of their own way, and be filled with their own devices.
32 Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha, ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi.
For the waywardness of the thoughtless shall slay them, and the confidence of fools shall destroy them.
33 Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi. Ọ ga-anọ jụụ na-enweghị ihe ọbụla ga-atụ ya egwu.”
But whoso hearkeneth unto me shall dwell securely, and shall be quiet without fear of evil.'

< Ilu 1 >