< Ilu 9 >
1 Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa.
Hekima amejenga nyumba yake; amechonga nguzo zake saba.
2 O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya.
Ameandaa nyama na kuchanganya divai yake; pia ameandaa meza yake.
3 O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị,
Amewatuma watumishi wake wa kike, naye huita kutoka mahali pa juu sana pa mji.
4 “Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị,
Anawaambia wale wasio na akili, “Wote ambao ni wajinga na waje hapa!
5 “Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara.
Njooni, mle chakula changu na mnywe divai niliyoichanganya.
6 Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”
Acheni njia zenu za ujinga nanyi mtaishi; tembeeni katika njia ya ufahamu.
7 Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.
“Yeyote anayemkosoa mwenye mzaha hukaribisha matukano; yeyote anayekemea mtu mwovu hupatwa na matusi.
8 Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.
Usimkemee mwenye mzaha la sivyo atakuchukia; mkemee mwenye hekima naye atakupenda.
9 Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya.
Mfundishe mtu mwenye hekima naye atakuwa na hekima zaidi; mfundishe mtu mwadilifu naye atazidi kufundishika.
10 Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
“Kumcha Bwana ndicho chanzo cha hekima, na kumjua Aliye Mtakatifu ni ufahamu.
11 Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.
Kwa maana kwa msaada wangu siku zako zitakuwa nyingi, na miaka itaongezwa katika maisha yako.
12 Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru, ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.
Kama wewe una hekima, hekima yako itakupa tuzo; kama wewe ni mtu wa mzaha, wewe mwenyewe ndiwe utateseka.”
13 Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ, o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya.
Mwanamke aitwaye Mpumbavu ana kelele; hana adabu na hana maarifa.
14 Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo,
Huketi kwenye mlango wa nyumba yake, juu ya kiti katika mahali pa juu sana pa mji,
15 na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku, bụ ndị na-aga mkpa ha,
akiita wale wapitao karibu, waendao moja kwa moja kwenye njia yao.
16 “Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.” Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche,
Anawaambia wale wasio na akili, “Wote ambao ni wajinga na waje hapa ndani!”
17 “Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ, nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.”
“Maji yaliyoibiwa ni matamu; chakula kinacholiwa sirini ni kitamu!”
18 Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ. (Sheol )
Lakini hawajui hata kidogo kuwa wafu wako humo, kwamba wageni wake huyo mwanamke wako katika vilindi vya kuzimu. (Sheol )