< Ilu 8 >

1 Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu? Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda?
Amagezi tegakoowoolera waggulu, n’okutegeera ne kuyimusa eddoboozi lyakwo?
2 Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ, nʼagbata ụzọ niile.
Ku ntikko y’ebifo ebigulumivu okumpi n’ekkubo, mu masaŋŋanzira, amagezi we gayimirira butengerera,
3 Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu,
ku mabbali g’enzigi eziyingira mu kibuga, ku miryango, gakoowoolera waggulu nga gagamba nti,
4 ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu.
Mmwe abantu, mmwe b’empita; nnyimusa eddoboozi lyange eri buli omu ali ku nsi.
5 Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta.
Mmwe abatategeera mufune okutegeera; nammwe abasirusiru mufune amagezi.
6 Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi,
Muwulirize kubanga nnina ebintu ebikulu eby’okubagamba, era mu kamwa kange muvaamu ebituufu.
7 Ọnụ m na-ekwu eziokwu nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị.
Akamwa kange koogera bituufu byereere; kubanga emimwa gyange gikyawa ebitali bya butuukirivu.
8 Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya.
Ebigambo by’emimwa gyange byonna bya bwenkanya tewali na kimu kikyamu oba kya bukuusa.
9 Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.
Ebigambo byange byonna bitegeerekeka eri oyo ategeera, era tebirina kabi eri oyo alina amagezi.
10 Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.”
Mu kifo kya ffeeza, londawo okuyigiriza kwange, era n’okumanya mu kifo kya zaabu ennongoose obulungi,
11 Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.
kubanga amagezi gasinga amayinja ag’omuwendo omungi, era n’ebyo byonna bye weegomba tebiyinza kugeraageranyizibwa nago.
12 “Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu.
Nze Magezi, mbeera wamu n’okuteesa okulungi, era mu nze mulimu okumanya n’okwawula ekirungi n’ekibi.
13 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.
Okutya Mukama kwe kukyawa ekibi; nkyawa amalala n’okwemanya, n’obuteeyisa bulungi n’enjogera ey’obubambaavu.
14 Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike.
Okuteesa okulungi n’okusalawo okw’amagezi bye byange; ntegeera era ndi wa buyinza.
15 Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.
Ku bwange, Magezi, bakabaka bafuga, abafuzi ne bakola amateeka ag’obwenkanya.
16 Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.
Abalangira bafuga ku bwange, n’abakungu bonna abafuga ku nsi.
17 Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.
Njagala abo abanjagala, n’abo abanyiikira okunnoonya bandaba.
18 Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume.
Obugagga n’ekitiibwa biri mu nze, obugagga obutakoma n’okukulaakulana.
19 Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo.
Ekibala kyange kisinga zaabu ennongoose, n’ebinvaamu bisinga ffeeza ey’omuwendo omungi.
20 Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.
Ntambulira mu kkubo ery’obutuukirivu, mu kkubo ery’obwenkanya,
21 Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.
n’abo abanjagala mbagaggawaza era nzijuza amawanika gaabwe.
22 “Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.
Mukama nze gwe yasooka okwoleka nga tannabaako kirala ky’akola.
23 Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa.
Nateekebwawo dda nnyo, ku lubereberye ng’ensi tennabaawo.
24 Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa,
Nateekebwawo ng’obuziba bw’ennyanja tebunnateekebwawo, nga n’emigga egireeta amazzi teginnabaawo,
25 tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta.
ng’ensozi tezinnateekebwa mu bifo byazo, nga n’obusozi tebunnabaawo;
26 E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.
nga tannakola nsi newaakubadde amalundiro gaakwo, wadde enfuufu eyasooka ey’oku nsi.
27 Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;
Naliwo ng’ateekawo eggulu mu kifo kyalyo, ne bwe yakola enkulungo kungulu ku buziba,
28 mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,
ate ne bwe yawanika ebire n’abinywereza waggulu mu bbanga, n’anywereza ddala ensulo z’amazzi,
29 mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.
bwe yawa ennyanja ensalo zaazo we zikoma, amazzi galeme kusukka we yagalagira, ne bwe yali ng’alamba emisingi gy’ensi.
30 Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya.
Nnali naye ng’omukozi omukugu, nga nzijudde essanyu lye erya buli lunaku, nga nsanyukira mu maaso ge bulijjo,
31 Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ!
nga nsanyukira mu nsi ye yonna, era nga ne nesiima olw’abaana b’abantu.
32 “Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.
Kale nno, batabani bange mumpulirize; balina omukisa abo abakwata amakubo gange!
33 Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.
Muwulirizenga okuyigirizibwa, mubenga n’amagezi, so temugalekanga.
34 Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;
Alina omukisa omuntu ampuliriza, alindirira nga bw’akuuma ku nzigi zange buli lunaku.
35 nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.
Kubanga buli andaba afuna obulamu, era afuna okuganja eri Mukama.
36 Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”
Oyo atannoonya yeerumya yekka, era n’abo bonna abankyawa banoonya kufa.

< Ilu 8 >