< Ilu 8 >
1 Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu? Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda?
Does not wisdom call out, and understanding raise her voice?
2 Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ, nʼagbata ụzọ niile.
On the heights overlooking the road, at the crossroads she takes her stand.
3 Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu,
Beside the gates to the city, at the entrances she cries out:
4 ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu.
“To you, O men, I call out, and my cry is to the sons of men.
5 Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta.
O simple ones, learn to be shrewd; O fools, gain understanding.
6 Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi,
Listen, for I speak of noble things, and the opening of my lips will reveal right.
7 Ọnụ m na-ekwu eziokwu nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị.
For my mouth will speak the truth, and wickedness is detestable to my lips.
8 Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya.
All the words of my mouth are righteous; none are crooked or perverse.
9 Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.
They are all plain to the discerning, and upright to those who find knowledge.
10 Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.”
Receive my instruction instead of silver, and knowledge rather than pure gold.
11 Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.
For wisdom is more precious than rubies, and nothing you desire compares with her.
12 “Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu.
I, wisdom, dwell together with prudence, and I find knowledge and discretion.
13 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.
To fear the LORD is to hate evil; I hate arrogant pride, evil conduct, and perverse speech.
14 Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike.
Counsel and sound judgment are mine; I have insight and strength.
15 Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.
By me kings reign, and rulers enact just laws;
16 Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.
By me princes rule, and all nobles who govern justly.
17 Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.
I love those who love me, and those who seek me early shall find me.
18 Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume.
With me are riches and honor, enduring wealth and righteousness.
19 Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo.
My fruit is better than gold, pure gold, and my harvest surpasses choice silver.
20 Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.
I walk in the way of righteousness, along the paths of justice,
21 Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.
bestowing wealth on those who love me and making their treasuries full.
22 “Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.
The LORD created me as His first course, before His works of old.
23 Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa.
From everlasting I was established, from the beginning, before the earth began.
24 Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa,
When there were no watery depths, I was brought forth, when no springs were overflowing with water.
25 tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta.
Before the mountains were settled, before the hills, I was brought forth,
26 E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.
before He made the land or fields, or any of the dust of the earth.
27 Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;
I was there when He established the heavens, when He inscribed a circle on the face of the deep,
28 mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,
when He established the clouds above, when the fountains of the deep gushed forth,
29 mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.
when He set a boundary for the sea, so that the waters would not surpass His command, when He marked out the foundations of the earth.
30 Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya.
Then I was a skilled craftsman at His side, and His delight day by day, rejoicing always in His presence.
31 Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ!
I was rejoicing in His whole world, delighting together in the sons of men.
32 “Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.
Now therefore, my sons, listen to me, for blessed are those who keep my ways.
33 Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.
Listen to instruction and be wise; do not ignore it.
34 Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;
Blessed is the man who listens to me, watching daily at my doors, waiting at the posts of my doorway.
35 nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.
For whoever finds me finds life and obtains the favor of the LORD.
36 Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”
But he who fails to find me harms himself; all who hate me love death.”