< Ilu 7 >

1 Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya, dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.
Ọmọ mi, pa ọ̀rọ̀ mi mọ́, sì fi àwọn òfin mi pamọ́ sínú ọkàn rẹ.
2 Debe iwu m ka ị dị ndụ, chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.
Pa òfin mi mọ́, ìwọ yóò sì yè tọ́jú ẹ̀kọ́ mi bí ẹyinlójú rẹ.
3 Kee ha na mkpịsịaka gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
Kọ wọ́n sí ọwọ́ òsì rẹ, má ṣe fi jẹun kọ wọ́n sí inú wàláà àyà rẹ.
4 Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya; hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.
Wí fún ọgbọ́n pé, “Ìwọ ni arábìnrin mi,” sì pe òye ní ìbátan rẹ.
5 Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko, ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.
Wọn yóò pa ó mọ́ kúrò lọ́wọ́ obìnrin alágbèrè, kúrò lọ́wọ́ àjèjì obìnrin àti ọ̀rọ̀ ìtànjẹ rẹ̀.
6 Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,
Ní ojú fèrèsé ilé è mi mo wo ìta láti ojú fèrèsé.
7 hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche, ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha, onye amamihe kọrọ,
Mo rí i láàrín àwọn aláìmọ̀kan mo sì kíyèsi láàrín àwọn ọ̀dọ́kùnrin, ọ̀dọ́ kan tí ó ṣe aláìgbọ́n.
8 ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,
Ó ń lọ ní pópónà ní tòsí i ilé alágbèrè obìnrin náà, ó ń rìn lọ sí ọ̀nà ilé e rẹ̀.
9 nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi.
Ní ìrọ̀lẹ́ bí oòrùn ṣe ń wọ̀, bí òkùnkùn ṣe ń bo ni lára.
10 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.
Bẹ́ẹ̀ ni obìnrin kan jáde wá láti pàdé rẹ̀, ó múra bí panṣágà pẹ̀lú ètè búburú.
11 (Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.
(Ó jẹ́ aláriwo àti alágídí, ìdí rẹ̀ kì í jókòó nílé;
12 Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)
bí ó ti ń já níhìn-ín ní ó ń já lọ́hùn ún gbogbo orígun ni ó ti ń ba ní ibùba.)
13 O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị:
Ó dìímú, ó sì fẹnukò ó ní ẹnu pẹ̀lú ojú díndín ó wí pé,
14 “Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,
“Mo ní ọrẹ àlàáfíà ní ilé; lónìí ni mo san ẹ̀jẹ́ mi.
15 Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa.
Nítorí náà ni n o ṣe jáde wá pàdé è rẹ; mo wá ọ káàkiri mo sì ti rí ọ!
16 Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.
Mo ti tẹ́ ibùsùn mi pẹ̀lú aṣọ aláràbarà láti ilẹ̀ Ejibiti.
17 Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m.
Mo ti fi nǹkan olóòórùn dídùn sí ibùsùn mi bí i òjìá, aloe àti kinamoni.
18 Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.
Wá, jẹ́ kí a lo ìfẹ́ papọ̀ ní kíkún títí di àárọ̀; jẹ́ kí a gbádùn ara wa pẹ̀lú ìfẹ́!
19 Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya.
Ọkọ ọ̀ mi ò sí nílé; ó ti lọ sí ìrìnàjò jíjìn.
20 O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”
Ó mú owó púpọ̀ lọ́wọ́ kò sì ní darí dé kí ó tó di ọ̀sán.”
21 Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.
Pẹ̀lú ọ̀rọ̀ dídùn ó sì í lọ́nà; ó tàn án jẹ pẹ̀lú ẹnu dídùn.
22 O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele nke na-aba nʼọnya,
Òun sì tọ̀ ọ́ lọ lẹsẹ̀ kan náà, bí i màlúù tí ń lọ sí ibi pípa, tàbí bí àgbọ̀nrín tí ń lọ sí ibi okùn ìso.
23 nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.
Títí tí ọ̀kọ̀ fi gún un ní ẹ̀dọ̀, bí ẹyẹ ṣe ń fẹ́ wọ inú okùn, láìmọ̀ pé yóò gba ẹ̀mí òun.
24 Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu.
Nítorí náà báyìí ẹ̀yin ọmọ mi, tẹ́tí sí mi fọkàn sí nǹkan tí mo sọ.
25 Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị; ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.
Má ṣe jẹ́ kí ọkàn rẹ kí ó yà sí ọ̀nà rẹ̀, tàbí kí ó rìn lọ sí ipa ọ̀nà rẹ̀.
26 Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.
Ọ̀pọ̀lọpọ̀ ni àwọn tí ó ti fà lulẹ̀. Ogunlọ́gọ̀ àwọn alágbára ni ó ti pa.
27 Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili, nke na-edubakwa nʼala ọnwụ. (Sheol h7585)
Ilé e rẹ̀ ni ọ̀nà tààrà sí isà òkú, tí ó lọ tààrà sí àgbàlá ikú. (Sheol h7585)

< Ilu 7 >