< Ilu 6 >

1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe, ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe,
Ndodana yami, uba uyisibambiso somakhelwane wakho, watshayela owezizwe isandla sakho,
2 ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya.
uthiywe ngamazwi omlomo wakho, ubanjwe ngamazwi omlomo wakho.
3 Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla.
Yenza lokhu khathesi, ndodana yami, uzophule, lokhu usesandleni sikamakhelwane wakho; hamba, uzithobe, umncengisise umakhelwane wakho.
4 Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra.
Unganiki amehlo akho ubuthongo, lokuwozela enkopheni zakho.
5 Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya.
Uzophule njengomziki esandleni somzingeli, lanjengenyoni esandleni somthiyi wenyoni.
6 Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.
Yana ebunyonyweni, vila, ubone indlela zabo, uhlakaniphe.
7 Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha,
Obuthi, bungelamkhokheli, induna, lombusi,
8 ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi.
bulungisa isinkwa sabo ehlobo, bubuthe ukudla kwabo esivunweni.
9 Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie?
Koze kube nini, vila, ulele? Uzavuka nini ebuthongweni bakho?
10 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike,
Ubuthongo obuncinyane, ukuwozela okuncinyane, ukusonga izandla okuncinyane ukuthi ulale,
11 ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
besebusiza ubuyanga bakho njengesihambi, lenswelo yakho njengomuntu olesihlangu.
12 Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya, onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ,
Umuntu kaBheliyali, umuntu okhohlakeleyo, ohamba lomlomo ophambeneyo,
13 onye ji iro na-egbu ikuanya ya, jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu na mkpịsịaka ya na-egosi ihe.
afice amehlo akhe, akhulume ngenyawo zakhe, afundise ngeminwe yakhe,
14 Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ, onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile.
ukuphambuka kusenhliziyweni yakhe, uceba okubi ngesikhathi sonke, ephosela ingxabano.
15 Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede; nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya.
Ngenxa yalokhu ingozi yakhe izafika masinyane, ahle ephuke, kuze kungabi leselapho.
16 Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
Lezizinto eziyisithupha iNkosi iyazizonda; yebo, eziyisikhombisa ziyizinengiso emphefumulweni wakhe:
17 Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
Amehlo aphakemeyo, ulimi oluqamba amanga, lezandla ezichitha igazi elingelacala,
18 Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
inhliziyo eceba amacebo amabi, inyawo eziphangisa ukugijimela ububi,
19 onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.
umfakazi wamanga ophafuza izinkohliso, lophosela ingxabano phakathi kwabazalwane.
20 Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị.
Ndodana yami, gcina umlayo kayihlo, ungakudeli ukufundisa kukanyoko.
21 Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, ka ị ghara ichefu ha.
Kubophele enhliziyweni yakho njalo, kubophele entanyeni yakho.
22 Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
Ekuhambeni kwakho kuzakukhokhela, ekulaleni kwakho kukulondoloze, lekuvukeni kwakho khona kukhulume lawe.
23 Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ,
Ngoba umlayo uyisibane, lokufundisa kuyikukhanya, lokukhuza kokulaya kuyindlela yempilo,
24 idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ.
ukuze kukugcine emfazini omubi, emazwini ayengayo olimi lowesifazana wemzini.
25 Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị.
Ungaloyisi ubuhle bakhe enhliziyweni yakho; angakuthathi ngenkophe zakhe.
26 Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.
Ngoba ngenxa yomfazi oyisiphingi ungafika ecezwini lwesinkwa, lomfazi womuntu uzingela umphefumulo oligugu.
27 Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya, ma uwe ya ereghị ọkụ?
Kambe, umuntu angaphatha umlilo esifubeni sakhe, lezigqoko zakhe zingatshi?
28 Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?
Umuntu angahamba phezu kwamalahle avuthayo, lenyawo zakhe zingatshi yini?
29 Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.
Unjalo ongena kumkamakhelwane wakhe; wonke omthintayo kayikuba msulwa.
30 Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike.
Kabalideleli isela, nxa liseba ukuthi ligcwalise umphefumulo walo, ngoba lilambile.
31 Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa. Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya.
Uba litholwa, lihlawula kuphindwe kasikhombisa, linika yonke impahla yendlu yalo.
32 Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya, nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi.
Ofeba lowesifazana uswela ingqondo; owenza lokhu nguye ochitha umphefumulo wakhe.
33 A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya, ihere ya agaghị ekwe ihichapụ.
Uzathola ukutshaywa lesigcono, lehlazo lakhe kaliyikwesulwa.
34 Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ; ọ gakwaghị enwe obi ebere nʼebe ọ nọ nʼụbọchị ọ ga-abọ ọbọ.
Ngoba ubukhwele bululaka lomuntu; ngakho kayikuba lasihawu ngosuku lwempindiselo.
35 Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya. O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ.
Kayikunanza loba yiyiphi inhlawulo, kayikuvuma lanxa usandisa isipho.

< Ilu 6 >