< Ilu 4 >
1 Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu, lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
Zwanini, madodana ami, izeluleko zikayihlo; lalelani lizuze ukuqedisisa.
2 Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m.
Ngilipha izifundo ezipheleleyo; ngakho lingalahli imfundiso yami.
3 Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
Ngathi ngisengumfana emzini kababa, ngisebuthakathaka, ngiyimi ngedwa ingane kamama,
4 ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
wangifundisa ubaba wathi, “Abambe amazwi ami ngenhliziyo yakho yonke; gcina imilayo yami ukuze uphile.
5 Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
Zuza ukuhlakanipha, zuza ukuqedisisa; ungawakhohlwa amazwi ami, kumbe ugudluke kuwo.
6 Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
Ungafulatheli ukuhlakanipha, kuzakuvikela; kuthande, kuzakulinda.
7 Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.
Ukuhlakanipha kuyinqaba; ngakho zuza ukuhlakanipha. Zuza ukuqedisisa loba kungathatha konke olakho.
8 Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.
Kugogose, kuzakuphakamisa; kugone, kuzakunika udumo.
9 Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”
Kuzakwethesa umqhele wamaluba omusa ekhanda lakho kukwethese umqhele wenkazimulo.”
10 Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
Zwana mntanami, yamukela lokho engikutshoyo, ukuze insuku zokuphila kwakho zibe zinengi.
11 M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.
Ngiyakukhokhela endleleni yokuhlakanipha, ngikuqondise ezindleleni eziqondileyo.
12 Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.
Nxa uhamba kawuyikuthikaza; nxa ugijima kawuyikukhubeka.
13 Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
Bambelela iziqondiso, ungayekethisi; zigcine kuhle ngoba ziyikuphila kwakho.
14 Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.
Ungayingeni indlela yababi njalo ungahambi endleleni yezigangi.
15 Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,
Ixwaye, ungahambi ngayo; itshiye uqhubeke ngeyakho indlela.
16 nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.
Phela kabalali bengenzanga ukuganga; badela ubuthongo ukuze baqale balimaze omunye umuntu.
17 Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara.
Badla isinkwa sobubi banathe iwayini lobudlwangudlwangu.
18 Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.
Indlela yabalungileyo injengovivi lokusa, kukhule ukukhanya kwalo kuze kuphelele emini.
19 Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.
Kodwa indlela yababi ifana lomnyama omkhulu; kabazi ukuthi kuyini okubakhubayo.
20 Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma.
Ndodana yami, zwana lokhu engikutshoyo; lalelisisa amazwi ami.
21 Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị,
Ungawasusi emehlweni akho, agcine enhliziyweni yakho;
22 nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.
ngoba ayikuphila kulabo abawafumanayo; lokuqina komzimba wonke womuntu.
23 Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
Phezu kwakho konke, gcina inhliziyo yakho, ngoba ingumthombo wokuphila kwakho.
24 Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta; kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
Lahla izibozi zamazwi emlonyeni wakho; ungakhuphi inkulumo yokuxhwala ezindebeni zakho.
25 Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu; atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
Khangelisa amehlo akho nta phambili, uwathi nhlo amehlo akho kulokho okuphambi kwakho.
26 Leruo ije ụkwụ gị anya, doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
Lungisa izindlela ukuze inyawo zakho zinyathele kuhle, uhambe ngezindlela eziqinileyo kuphela.
27 Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe; si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.
Ungaphambukeli kwesokunene loba kwesokhohlo; ugcine unyawo lwakho lunganyatheli okubi.