< Ilu 31 >

1 Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.
Àwọn ọ̀rọ̀-ìjìnlẹ̀ ti Lemueli ọba, ọ̀rọ̀ ẹ̀kọ́ tí ìyá rẹ̀ kọ́ ọ,
2 Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile.
“Gbọ́ ìwọ ọmọ mi, gbọ́ ìwọ ọmọ inú mi! Gbọ́ ìwọ ọmọ ẹ̀jẹ́ mi.
3 Enyela ụmụ nwanyị ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.
Má ṣe lo agbára rẹ lórí obìnrin, okun rẹ lórí àwọn tí ó pa àwọn ọba run.
4 Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
“Kì í ṣe fún àwọn ọba, ìwọ Lemueli, kì í ṣe fún ọba láti mu ọtí wáìnì, kì í ṣe fún alákòóso láti máa wá ọtí líle,
5 Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.
kí wọn má ba à mu ọtí yó kí wọn sì gbàgbé ohun tí òfin wí, kí wọn sì fi ẹ̀tọ́ àwọn tí ara ń ni dù wọ́n.
6 Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.
Fi ọtí líle fún àwọn tí ń ṣègbé wáìnì fún àwọn tí ó wà nínú ìrora.
7 Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.
Jẹ́ kí wọn mu ọtí kí wọn sì gbàgbé òsì wọn kí wọn má sì rántí òsì wọn mọ́.
8 Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.
“Sọ̀rọ̀ lórúkọ àwọn tí kò le sọ̀rọ̀ fúnra wọn fún ẹ̀tọ́ àwọn ẹni tí ń parun.
9 Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi. Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.
Sọ̀rọ̀ kí o sì ṣe ìdájọ́ àìṣègbè jà fún ẹ̀tọ́ àwọn tálákà àti aláìní.”
10 Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
Ta ni ó le rí aya oníwà rere? Ó níye lórí ju iyùn lọ.
11 Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya, ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.
Ọkọ rẹ̀ ní ìgbẹ́kẹ̀lé púpọ̀ nínú rẹ̀ kò sì ṣí ìwà rere tí kò pé lọ́wọ́ rẹ̀.
12 Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
Ire ní ó ń ṣe fún un, kì í ṣe ibi ní gbogbo ọjọ́ ayé rẹ̀.
13 Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.
Ó sa aṣọ irun àgùntàn olówùú àti ọ̀gbọ̀ Ó sì ṣiṣẹ́ pẹ̀lú ìyárí.
14 Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
Ó dàbí ọkọ̀ ojú omi tí àwọn oníṣòwò; ó ń gbé oúnjẹ rẹ̀ wá láti ọ̀nà jíjìn.
15 Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
Ó dìde nígbà tí òkùnkùn sì kùn; ó ṣe oúnjẹ fún ìdílé rẹ̀ àti ìpín oúnjẹ fún àwọn ìránṣẹ́bìnrin rẹ̀.
16 Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.
Ó kíyèsi oko kan, ó sì rà á; nínú ohun tí ó ń wọlé fún un ó gbin ọgbà àjàrà rẹ̀.
17 Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
Ó bẹ̀rẹ̀ iṣẹ́ rẹ̀ tagbára tagbára apá rẹ̀ le koko fún iṣẹ́.
18 Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
Ó rí i pé òwò òun pé fìtílà rẹ̀ kì í sì í kú ní òru.
19 Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
Ní ọwọ́ rẹ̀, ó di kẹ̀kẹ́ òwú mú ó sì na ọwọ́ rẹ̀ di ìrànwú mú.
20 Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
O la ọwọ́ rẹ̀ sí àwọn tálákà ó sì na ọwọ́ rẹ̀ sí àwọn aláìní.
21 Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.
Nígbà tí òjò-dídì rọ̀, kò bẹ̀rù nítorí ìdílé rẹ̀ nítorí gbogbo wọn ni ó wọ aṣọ tí ó nípọn.
22 Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo dụọ.
Ó ṣe aṣọ títẹ́ fún ibùsùn rẹ̀; ẹ̀wù dáradára àti elése àlùkò ni aṣọ rẹ̀.
23 Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.
A bọ̀wọ̀ fún ọkọ rẹ̀ ní ẹnu ibodè ìlú níbi tí ó ń jókòó láàrín àwọn àgbàgbà ìlú.
24 Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
Ó ń ṣe àwọn aṣọ dáradára ó sì ń tà wọ́n ó sì ń kó ọjà fún àwọn oníṣòwò.
25 Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ. Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
Agbára àti ọlá ni ó wò ọ́ láṣọ ó le fi ọjọ́ iwájú rẹ́rìn-ín.
26 Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
A sọ̀rọ̀ pẹ̀lú ọgbọ́n ìkọ́ni òtítọ́ sì ń bẹ létè e rẹ̀
27 Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.
Ó ń bojútó gbogbo ètò ilé rẹ̀ kì í sì í jẹ oúnjẹ ìmẹ́lẹ́.
28 Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.
Àwọn ọmọ rẹ̀ dìde wọ́n sì pè é ní alábùkún ọkọ rẹ̀ pẹ̀lú ń gbóríyìn fún un.
29 Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”
“Ọ̀pọ̀lọpọ̀ obìnrin ní ń ṣe nǹkan ọlọ́lá ṣùgbọ́n ìwọ ju gbogbo wọn lọ.”
30 Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.
Ojú dáradára a máa tan ni, ẹwà sì jẹ́ asán nítorí obìnrin tí ó bẹ̀rù Olúwa yẹ kí ó gba oríyìn.
31 E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.
Sì fún un ní èrè tí ó tọ́ sí i kí o sì jẹ́ kí iṣẹ́ rẹ̀ fún un ní ìyìn ní ẹnu ibodè ìlú.

< Ilu 31 >