< Ilu 31 >

1 Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.
The words of Lemuel the king, —the strain which was taught him by his mother: —
2 Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile.
What, my son? and what, the son of my womb? aye what, the son of my vows?
3 Enyela ụmụ nwanyị ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.
Do not give, to women, thy strength, nor thy ways, to them who ruin kings.
4 Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
It is not for kings, O Lemuel, it is not for kings to drink wine, nor, for dignitaries, to desire strong drink,
5 Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.
Lest he drink, and forget that which is decreed, and alter the plea of any who are sorely oppressed.
6 Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.
Give strong drink, to him that is perishing, and wine, to such as are embittered in soul:
7 Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.
Let him drink, and forget his poverty, and, his wearying toil, let him remember no more.
8 Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.
Open thy mouth for the dumb, for the cause of all the children of the departed.
9 Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi. Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.
Open thy mouth—judge righteously, —and administer justice for the poor and the needy.
10 Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
A virtuous woman, who can find? for, far beyond corals, is her worth.
11 Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya, ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.
The heart of her husband, trusteth her, and, gain, he shall not lack:
12 Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
She doeth him good and not evil, all the days of her life:
13 Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.
She seeketh wool and flax, and worketh willingly with her hands:
14 Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
She is like the ships of the merchant, from afar, she bringeth in her food;
15 Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
And she riseth, while yet it is night, and giveth food to her household, and a task to her maidens:
16 Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.
She considereth a field, and procureth it, Out of the fruit of her hands, she planteth a vineyard:
17 Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
She girdeth, with strength her loins, and putteth vigour into her arms:
18 Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
She tasteth, whether, good, be her merchandise, and her lamp, goeth not out by night:
19 Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
Her hands, she putteth forth to the distaff, and, her palms, lay hold of the spindle:
20 Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
Her palm, she spreadeth out to the oppressed, and, her hands, she extendeth to the needy:
21 Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.
She feareth not, for her household, because of the snow, for, all her household, are clothed with crimson:
22 Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo dụọ.
Coverlets, she maketh for herself, Of white linen and of purple, is her clothing:
23 Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.
Known in the gates, is her husband, when he sitteth, with the elders of the land:
24 Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
Fine linen wraps, she maketh and selleth, and, girdles, doth she deliver to the trader:
25 Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ. Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
Strength and dignity, are her clothing, and she laugheth at the time to come:
26 Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
Her mouth, she openeth with wisdom, and, the instruction of kindness, is on her tongue:
27 Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.
She looketh well to the goings of her household, and, the bread of idleness, will she not eat.
28 Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.
Her children rise up, and call her happy! her husband, and he praiseth her: —
29 Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”
Many daughters, have done virtuously, but, thou, excellest them all!
30 Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.
Deceitful is loveliness and vain is beauty, The woman that revereth Yahweh, she, shall be praised:
31 E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.
Give her of the fruit of her own hands, and let her own works, praise her in the gates.

< Ilu 31 >