< Ilu 30 >
1 Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa, Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal: “Ike agwụla m, Chineke ma a pụrụ imeri.
Amazwi kaAguri indodana kaJake umMasa. Umuntu wathi kuIthiyeli, kuIthiyeli loUkhali:
2 Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla; Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe.
Isibili, ngiyisithutha kulomuntu, kangilakuqedisisa komuntu.
3 Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
Kangifundanga inhlakanipho, kangilwazi ulwazi lwabangcwele.
4 Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa? Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya? Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya? Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ? Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya? Gịnịkwa bụ aha nwa ya?
Ngubani owenyukela emazulwini njalo wehla? Ngubani oqoqe wafumbatha umoya ezandleni zakhe? Ngubani ogoqele amanzi esembathweni? Ngubani omise yonke imikhawulo yomhlaba? Lingubani ibizo lakhe, lebizo lendodana yakhe lingubani, uba usazi?
5 “Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha, Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
Lonke ilizwi likaNkulunkulu licwengekile; uyisihlangu kwabaphephela kuye.
6 Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya, ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha.
Ungengezeleli emazwini akhe, hlezi akukhuze, utholwe ungumqambimanga.
7 “O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha:
Zimbili izinto engizicele kuwe; ungangigodleli zona ngingakafi.
8 Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ. Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya, kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
Susa khatshana lami ize lamazwi amanga; ungangiphi ubuyanga loba inotho; ungiphe ukudla kwesabelo sami.
9 Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.
Hlezi ngisuthe, ngikuphike ngithi: Ngubani iNkosi? Kumbe hlezi ngibe ngumyanga, ngintshontshe, ngithathe ngeze ibizo likaNkulunkulu wami.
10 “Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.
Ungahlebi inceku enkosini yayo, hlezi ikuthuke, ube lecala.
11 “Ọ dị ndị na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha;
Kulesizukulwana esithuka uyise, esingabusisi unina;
12 Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
isizukulwana esihlambulukileyo emehlweni aso, kodwa esingahlanjululwanga engcekezeni yaso;
13 Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
isizukulwana omehlo aso aphakeme kangaka, lenkophe zaso ziphakanyisiwe;
14 Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.
isizukulwana omazinyo aso zinkemba, lesimazinyo aso omhlathi zingqamu, zokudla abayanga emhlabeni, labaswelayo ebantwini.
15 “Etu nwere ụmụ nwanyị abụọ ndị na-eti, ‘Nye, nye.’ “Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju. E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’
Umkhaza ulamadodakazi amabili athi: Phana, phana; lezizontathu kazisuthi; ezine kazitsho ukuthi: Kwanele.
16 Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’ (Sheol )
Ingcwaba, lesizalo esiyinyumba, umhlaba ongasuthi amanzi, lomlilo ongathi: Kwanele. (Sheol )
17 “Onye ahụ na-akwa nna ya emo, nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị, ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya, udele ga-erikwa anụ ahụ ya.
Ilihlo eliklolodela uyise, lelidelela ukulalela unina, amawabayi esihotsha azalikopola, labantwana bamanqe bazalidla.
18 “Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ!
Lezizinto ezintathu ziyisimangaliso esikhulu kimi, yebo, ezine engingazaziyo:
19 Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe; otu agwọ si akpụ nʼelu nkume, otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri; na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ.
Indlela yokhozi emazulwini, indlela yenyoka edwaleni, indlela yomkhumbi enhliziyweni yolwandle, lendlela yejaha entombini.
20 “Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko, Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya, na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’
Injalo indlela yowesifazana oliwule; udla, esule umlomo wakhe, athi: Kangenzanga isiphambeko.
21 “Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji, nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide,
Ngenxa yezinto ezintathu umhlaba uyazamazama, yebo, ngenxa yezine ongezithwale:
22 Ohu ghọrọ eze, onye nzuzu ihe na-agara nke ọma,
Ngenxa yesigqili nxa sibusa, lesithutha nxa sisuthi ukudla,
23 nwanyị obi ilu mesịrị lụta dị, na odibo nwanyị ghọrọ nwunye nna ya ukwu.
ngenxa yesaliwakazi nxa sendile, lencekukazi nxa iyindlalifa yenkosikazi yayo.
24 “Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa, ma ha maa ihe nke ukwuu.
Lezi ezine zingezincinyane zomhlaba, kanti zihlakaniphile zenziwe zihlakaniphe:
25 Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi.
Ubunyonyo buyisizwe esingelamandla, kanti bulungisa ukudla kwabo ehlobo.
26 Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike, ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume.
Imbila ziyisizwe esingelamandla, kanti zimisa indlu yazo edwaleni.
27 Igurube enweghị eze, ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị.
Intethe kazilankosi, kanti zonke ziphuma zehlukene ngamaviyo.
28 Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.
Umbankwa ubambelela ngezandla ezimbili, njalo usezigodlweni zenkosi.
29 “Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube, mbaa, ha dị anọ:
Lezi ezintathu zinyathela kuhle, yebo, ezine zihamba kuhle:
30 Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu,
Isilwane esilamandla phakathi kwenyamazana, esingeyikubuyela emuva ngenxa yobuso loba ngobukabani;
31 na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị, na mkpi, na eze ndị agha ya gbara gburugburu.
inja ebhince okhalweni, kumbe impongo; lenkosi ileviyo lamabutho.
32 “Ọ bụrụ na i meela ihe nzuzu site nʼifuli onwe gị elu maọbụ zube nzube ọjọọ, anyala isi nʼihi ya, were aka gị kpuchie ọnụ gị nʼihere.
Uba ube yisithutha ngokuziphakamisa, njalo uba ucebe okubi, beka isandla emlonyeni.
33 A pịaa mmiri ara ehi a na-ewepụta mmanụ ara ehi; iti mmadụ aka nʼimi na-akpata ịgba ọbara, otu a kwa ikpali iwe na-eweta ise okwu.”
Ngoba ukuphehlwa kochago kuveza iphehla, lokucindezelwa kwempumulo kuveza igazi, lokucindezelwa kwentukuthelo kuveza ingxabano.