< Ilu 30 >

1 Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa, Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal: “Ike agwụla m, Chineke ma a pụrụ imeri.
The words of Agur, the son of Jakeh, even his prophecy; the inspired utterance of the man to Ithiel, even to Ithiel and Ucal.
2 Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla; Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe.
Truly I am more stupid than any man; There is not in me the understanding of a man.
3 Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
I have not learned wisdom, Nor have I gained the knowledge of the Most Holy.
4 Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa? Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya? Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya? Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ? Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya? Gịnịkwa bụ aha nwa ya?
Who hath gone up into heaven and come down? Who hath gathered the wind in his fists? Who hath bound up the waters in a garment? Who hath established all the ends of the earth? What is his name, and what his son's name, if thou knowest?
5 “Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha, Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
Every word of God is pure; A shield is he to them that put their trust in him.
6 Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya, ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha.
Add not to his words, Lest he rebuke thee, and thou be found a liar.
7 “O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha:
Two things do I ask of thee; Withhold them not from me, before I die!
8 Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ. Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya, kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
Remove far from me falsehood and lies; Give me neither poverty nor riches; Feed me with the food which is needful for me;
9 Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.
Lest I be full, and deny thee, And say, “Who is the LORD?” Or lest I be poor, and steal, And violate the name of my God.
10 “Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.
Talk not against a servant to his master, Lest he curse thee, and thou suffer for it.
11 “Ọ dị ndị na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha;
There is a class of men that curse their fathers, And do not bless their mothers.
12 Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
There is a class who are pure in their own eyes, And yet are not washed from their filthiness.
13 Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
There is a class, —O how lofty are their eyes, And how are their eyelids lifted up!
14 Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.
There is a class, whose teeth are swords, And their jaw-teeth knives, To devour the poor from off the earth, And the needy from among men.
15 “Etu nwere ụmụ nwanyị abụọ ndị na-eti, ‘Nye, nye.’ “Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju. E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’
The vampire hath two daughters; “Give! give!” [[is their cry.]] There are three things which are never satisfied; Yea, four which say not, “Enough!”
16 Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’ (Sheol h7585)
The underworld, and the barren womb; The earth, which is not satiated with water, And fire, which never saith, “It is enough!” (Sheol h7585)
17 “Onye ahụ na-akwa nna ya emo, nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị, ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya, udele ga-erikwa anụ ahụ ya.
The eye that mocketh at a father, And scorneth to obey a mother, The ravens of the valley shall pick it out, And the young eagles shall eat it.
18 “Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ!
These three things are too wonderful for me; Yea, there are four which I understand not:
19 Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe; otu agwọ si akpụ nʼelu nkume, otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri; na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ.
The track of an eagle in the air, The track of a serpent upon a rock, The track of a ship in the midst of the sea, And the track of a man with a maid.
20 “Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko, Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya, na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’
Such is the way of an adulterous woman; She eateth, and wipeth her mouth, And saith, “I have done nothing wrong.”
21 “Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji, nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide,
Under three things is the earth disquieted; Yea, under four it cannot bear up:
22 Ohu ghọrọ eze, onye nzuzu ihe na-agara nke ọma,
Under a servant when he becometh a king, And a fool when he is filled with bread;
23 nwanyị obi ilu mesịrị lụta dị, na odibo nwanyị ghọrọ nwunye nna ya ukwu.
Under an odious woman when she becometh a wife, And a handmaid when she becometh heir to her mistress.
24 “Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa, ma ha maa ihe nke ukwuu.
There are four things which are small upon the earth, Yet are they wise, instructed in wisdom.
25 Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi.
The ants are a people not strong, Yet they prepare in the summer their food.
26 Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike, ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume.
The conies are a feeble people, Yet do they make their houses in the rocks.
27 Igurube enweghị eze, ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị.
The locusts have no king, Yet do they all go forth in bands.
28 Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.
The lizard seizeth with its hands, And is in king's palaces.
29 “Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube, mbaa, ha dị anọ:
These three have a graceful step; Yea, four are graceful in their walk:
30 Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu,
The lion, the hero among beasts, Which turneth not back for any;
31 na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị, na mkpi, na eze ndị agha ya gbara gburugburu.
The loin-girded war-horse, the he-goat, And a king who cannot be withstood.
32 “Ọ bụrụ na i meela ihe nzuzu site nʼifuli onwe gị elu maọbụ zube nzube ọjọọ, anyala isi nʼihi ya, were aka gị kpuchie ọnụ gị nʼihere.
If thou hast been foolish in lifting thyself up, And hast meditated evil, Put thy hand on thy mouth!
33 A pịaa mmiri ara ehi a na-ewepụta mmanụ ara ehi; iti mmadụ aka nʼimi na-akpata ịgba ọbara, otu a kwa ikpali iwe na-eweta ise okwu.”
For, as the pressing of milk bringeth forth cheese, And as the pressing of the nose bringeth forth blood, So the pressing of anger bringeth forth strife.

< Ilu 30 >