< Ilu 3 >

1 Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị.
Ọmọ mi, má ṣe gbàgbé ẹ̀kọ́ mi. Ṣùgbọ́n pa òfin mi mọ́ sí ọkàn rẹ.
2 Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu.
Nítorí ọjọ́ gígùn, ẹ̀mí gígùn, àti àlàáfíà, ni wọn yóò fi kùn un fún ọ.
3 Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
Má ṣe jẹ́ kí ìfẹ́ àti òtítọ́ ṣíṣe fi ọ́ sílẹ̀ láéláé so wọ́n mọ́ ọrùn rẹ, kọ wọ́n sí wàláà àyà rẹ.
4 Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.
Nígbà náà ni ìwọ yóò rí ojúrere àti orúkọ rere ní ojú Ọlọ́run àti lójú ènìyàn.
5 Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.
Gbẹ́kẹ̀lé Olúwa pẹ̀lú gbogbo ọkàn rẹ má ṣe sinmi lé òye ara à rẹ.
6 Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Mọ̀ ọ́n ní gbogbo ọ̀nà rẹ òun yóò sì máa tọ́ ipa ọ̀nà rẹ.
7 A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
Má ṣe jẹ́ ọlọ́gbọ́n lójú ara à rẹ bẹ̀rù Olúwa kí o sì kórìíra ibi.
8 Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
Èyí yóò mú ìlera fún ara rẹ àti okun fún àwọn egungun rẹ.
9 Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.
Fi ọrọ̀ rẹ bọ̀wọ̀ fún Olúwa, pẹ̀lú àkọ́so oko rẹ,
10 Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.
nígbà náà ni àká rẹ yóò kún àkúnya àgbá rẹ yóò kún àkúnwọ́sílẹ̀ fún wáìnì tuntun.
11 Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
Ọmọ mi, má ṣe kẹ́gàn ìbáwí Olúwa má sì ṣe bínú nígbà tí ó bá ń bá ọ wí,
12 Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
nítorí Olúwa a máa bá àwọn tí ó fẹ́ràn wí bí baba ti í bá ọmọ tí ó bá nínú dídùn sí wí.
13 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta.
Ìbùkún ni fún ẹni tí ó ní ìmọ̀, ẹni tí ó tún ní òye sí i,
14 Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
nítorí ó ṣe èrè ju fàdákà lọ ó sì ní èrè lórí ju wúrà lọ.
15 Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
Ó ṣe iyebíye ju iyùn lọ; kò sí ohunkóhun tí a lè fiwé e nínú ohun gbogbo tí ìwọ fẹ́.
16 Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
Ẹ̀mí gígùn ń bẹ ní ọwọ́ ọ̀tún rẹ̀; ní ọwọ́ òsì rẹ sì ni ọrọ̀ àti ọlá.
17 Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.
Àwọn ọ̀nà rẹ jẹ́ ọ̀nà ìtura, òpópónà rẹ sì jẹ́ ti àlàáfíà.
18 Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.
Igi ìyè ni ó jẹ́ fún gbogbo ẹni tí ó bá gbà á; àwọn tí ó bá sì dìímú yóò rí ìbùkún gbà.
19 Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.
Nípa ọgbọ́n, Olúwa fi ìpìlẹ̀ ilẹ̀ ayé sọlẹ̀; nípa òye, ó fi àwọn ọ̀run sí ipò wọn;
20 Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi.
nípa ìmọ̀ rẹ̀ ó pín ibú omi ní yà, àwọsánmọ̀ sì ń sẹ ìrì.
21 Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke,
Ọmọ mi, pa ọgbọ́n tí ó yè kooro àti ìmòye mọ́, má jẹ́ kí wọn lọ kúrò ní ibi tí ojú rẹ ti le tó wọn.
22 nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.
Wọn yóò jẹ́ ìyè fún ọ, àti ẹ̀ṣọ́ fún ọrùn rẹ.
23 Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.
Nígbà náà ni ìwọ yóò bá ọ̀nà rẹ lọ ní àìléwu, ìwọ kì yóò sì kọsẹ̀.
24 Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.
Nígbà tí ìwọ bá dùbúlẹ̀, ìwọ kì yóò bẹ̀rù, nígbà tí ìwọ bá dùbúlẹ̀, oorun rẹ yóò jẹ́ oorun ayọ̀.
25 Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume.
Má ṣe bẹ̀rù ìdààmú òjijì, tàbí ti ìparun tí ó ń dé bá àwọn ènìyàn búburú.
26 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị.
Nítorí Olúwa yóò jẹ́ ìgbẹ́kẹ̀lé rẹ, kì yóò sì jẹ́ kí ẹsẹ̀ rẹ bọ́ sínú pàkúté.
27 Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.
Má ṣe fa ọwọ́ ìre sẹ́yìn kúrò lọ́dọ̀ àwọn tí ṣe tìrẹ, nígbà tí ó bá wà ní ìkápá rẹ láti ṣe ohun kan.
28 A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa.
Má ṣe wí fún aládùúgbò rẹ pé, “Padà wá nígbà tó ṣe díẹ̀; èmi yóò fi fún ọ ní ọ̀la,” nígbà tí o ní i pẹ̀lú rẹ nísinsin yìí.
29 Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ.
Má ṣe pète ohun búburú fún aládùúgbò rẹ, ti o gbé nítòsí rẹ, tí ó sì fọkàn tán ọ.
30 Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla.
Má ṣe fẹ̀sùn kan ènìyàn láìnídìí, nígbà tí kò ṣe ọ́ ní ibi kankan rárá.
31 Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla.
Má ṣe ṣe ìlara ènìyàn jàgídíjàgan tàbí kí o yàn láti rìn ní ọ̀nà rẹ̀.
32 Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma.
Nítorí Olúwa kórìíra ènìyàn aláyídáyidà ṣùgbọ́n a máa fọkàn tán ẹni dídúró ṣinṣin.
33 Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume.
Ègún Olúwa ń bẹ lórí ilé ènìyàn búburú, ṣùgbọ́n ó bùkún fún ilé olódodo.
34 Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.
Ó fi àwọn ẹlẹ́yà ṣe yẹ̀yẹ́, ṣùgbọ́n ó fi oore-ọ̀fẹ́ fún onírẹ̀lẹ̀.
35 Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere.
Ọlọ́gbọ́n jogún iyì, ṣùgbọ́n àwọn aṣiwèrè ni yóò ru ìtìjú wọn.

< Ilu 3 >