< Ilu 29 >

1 Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ, nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.
Moto oyo atiaka moto makasi soki bapameli ye, akokweyisama na pwasa mpe akobika te.
2 Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ, ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
Soki bato ya sembo bakomi ebele, bato basepelaka; kasi soki bato mabe bakomi koyangela, bato balelaka.
3 Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
Moto oyo alingaka bwanya asalaka esengo ya tata na ye, kasi moto oyo alandaka basi ya ndumba akosilisa bomengo na ye nyonso.
4 Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
Mokonzi oyo akambaka na bosembo ayeisaka kimia na mokili na ye, kasi mokonzi oyo afutisaka mpako ebele abebisaka mokili yango.
5 Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
Moto oyo alobaka na moninga na ye maloba ya sukali atielaka ye motambo na se ya matambe.
6 Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama. Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.
Lisumu ya moto mabe ezalaka na motambo, kasi moto ya sembo agangaka na esengo mpe asepelaka.
7 Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.
Moto ya sembo ayebaka pasi ya babola, kasi moto mabe ayebaka na ye kutu yango te.
8 Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile, ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.
Batioli batiaka mobulu kati na engumba, kasi bato ya bwanya basilisaka kanda.
9 Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
Soki moto ya bwanya akei kosamba elongo na moto ya liboma, ezala asiliki to aseki, akotikala kozala na kimia te.
10 Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị, ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.
Bato oyo basopaka makila balingaka bato ya sembo te, kasi bato malamu balukaka bato ya sembo.
11 Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
Zoba alandaka baposa nyonso ya motema na ye, kasi moto ya bwanya akangaka yango mpe akitisaka yango.
12 Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
Soki mokonzi akomi koyoka makambo ya lokuta, basali na ye nyonso bakokoma bato mabe.
13 Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a: ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
Mobola mpe monyokoli bazali na likambo moko ya lisanga: Yawe angengisaka miso ya bango mibale.
14 Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe, a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
Mokonzi oyo asambisaka babola na bosembo, kiti na ye ya bokonzi ekolendisama tango nyonso.
15 Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa, ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
Fimbu mpe pamela epesaka bwanya, kasi mwana oyo basundola ayokisaka mama na ye soni.
16 Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị, ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.
Soki bato mabe bakomi ebele, mabe mpe ekomaka ebele; kasi bato ya sembo bakomona bango kokweya.
17 Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
Pesa mwana na yo etumbu, bongo okozala na kimia mpe akotondisa motema na yo na esengo.
18 Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro, ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
Soki emoniseli ezali te, bato bakotambola ngulungulu. Esengo na moto oyo atosaka Mobeko!
19 Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị, nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.
Bapamelaka mosali na maloba te; pamba te akososola, kasi akoyoka te.
20 Olileanya dịrị onye nzuzu karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.
Soki omoni moto kowela koloba liboso ete akanisa, malamu kotia elikya na zoba, kasi na ye te.
21 Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi, ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.
Moto oyo alengelaka mosali na ye wuta bolenge akosuka na kokomisa ye moto makasi.
22 Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ, onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.
Moto ya kanda amemaka koswana, mpe moto oyo atombokaka noki akomaka na mabe koleka.
23 Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa, ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.
Lolendo ya moto ekitisaka ye, kasi moto ya komikitisa azwaka lokumu.
24 Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha, a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.
Moto oyo akabolaka biloko elongo na moyibi amiyinaka; ayokaka bilakeli mabe, kasi amekaka te kofunda ye.
25 Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya, ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.
Kobanga bato ezalaka motambo na se ya matambe, kasi Yawe abatelaka moto oyo atiaka elikya na Ye.
26 Ị chọrọ ikpe ziri ezi? Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.
Bato ebele balukaka kokoma balingami ya mokonzi, nzokande ezali Yawe nde apesaka oyo ekoki na moto na moto.
27 Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị; ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.
Bato ya sembo bayinaka moto ya masumu, mpe moto mabe ayinaka etamboli ya bato ya sembo.

< Ilu 29 >