< Ilu 29 >

1 Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ, nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.
Un homme qui mérite d’être repris, et qui raidit le cou, Sera brisé subitement et sans remède.
2 Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ, ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
Quand les justes se multiplient, le peuple est dans la joie; Quand le méchant domine, le peuple gémit.
3 Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
Un homme qui aime la sagesse réjouit son père, Mais celui qui fréquente des prostituées dissipe son bien.
4 Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
Un roi affermit le pays par la justice, Mais celui qui reçoit des présents le ruine.
5 Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
Un homme qui flatte son prochain Tend un filet sous ses pas.
6 Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama. Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.
Il y a un piège dans le péché de l’homme méchant, Mais le juste triomphe et se réjouit.
7 Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.
Le juste connaît la cause des pauvres, Mais le méchant ne comprend pas la science.
8 Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile, ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.
Les moqueurs soufflent le feu dans la ville, Mais les sages calment la colère.
9 Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
Si un homme sage conteste avec un insensé, Il aura beau se fâcher ou rire, la paix n’aura pas lieu.
10 Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị, ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.
Les hommes de sang haïssent l’homme intègre, Mais les hommes droits protègent sa vie.
11 Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
L’insensé met en dehors toute sa passion, Mais le sage la contient.
12 Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
Quand celui qui domine a égard aux paroles mensongères, Tous ses serviteurs sont des méchants.
13 Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a: ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
Le pauvre et l’oppresseur se rencontrent; C’est l’Éternel qui éclaire les yeux de l’un et de l’autre.
14 Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe, a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
Un roi qui juge fidèlement les pauvres Aura son trône affermi pour toujours.
15 Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa, ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
La verge et la correction donnent la sagesse, Mais l’enfant livré à lui-même fait honte à sa mère.
16 Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị, ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.
Quand les méchants se multiplient, le péché s’accroît; Mais les justes contempleront leur chute.
17 Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
Châtie ton fils, et il te donnera du repos, Et il procurera des délices à ton âme.
18 Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro, ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
Quand il n’y a pas de révélation, le peuple est sans frein; Heureux s’il observe la loi!
19 Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị, nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.
Ce n’est pas par des paroles qu’on châtie un esclave; Même s’il comprend, il n’obéit pas.
20 Olileanya dịrị onye nzuzu karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.
Si tu vois un homme irréfléchi dans ses paroles, Il y a plus à espérer d’un insensé que de lui.
21 Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi, ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.
Le serviteur qu’on traite mollement dès l’enfance Finit par se croire un fils.
22 Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ, onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.
Un homme colère excite des querelles, Et un furieux commet beaucoup de péchés.
23 Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa, ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.
L’orgueil d’un homme l’abaisse, Mais celui qui est humble d’esprit obtient la gloire.
24 Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha, a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.
Celui qui partage avec un voleur est ennemi de son âme; Il entend la malédiction, et il ne déclare rien.
25 Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya, ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.
La crainte des hommes tend un piège, Mais celui qui se confie en l’Éternel est protégé.
26 Ị chọrọ ikpe ziri ezi? Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.
Beaucoup de gens recherchent la faveur de celui qui domine, Mais c’est l’Éternel qui fait droit à chacun.
27 Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị; ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.
L’homme inique est en abomination aux justes, Et celui dont la voie est droite est en abomination aux méchants.

< Ilu 29 >