< Ilu 28 >
1 Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha, ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.
Ènìyàn búburú ń sá bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé ẹnìkan kò lé e ṣùgbọ́n olódodo láyà bí i kìnnìún.
2 Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi, ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.
Nígbà tí orílẹ̀-èdè bá ní orí kunkun, àwọn ọba rẹ̀ a máa pọ̀, ṣùgbọ́n olóye àti onímọ̀ a máa pa òfin mọ́.
3 Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye, bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.
Ọba tí ó ni àwọn tálákà lára dàbí àgbàrá òjò tí ó ń gbá gbogbo ọ̀gbìn lọ.
4 Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume, ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.
Àwọn tí ó kọ òfin sílẹ̀ a máa gbóríyìn fún ènìyàn búburú ṣùgbọ́n àwọn tí ó pa òfin mọ́ kọjú ìjà sí ènìyàn búburú.
5 Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara, ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.
Òye ìdájọ́ òdodo kò yé àwọn ẹni ibi ṣùgbọ́n ó yé àwọn tí ń wá Olúwa dáradára.
6 Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.
Ó sàn láti jẹ́ tálákà tí ìrìn rẹ̀ jẹ́ aláìlábùkù ju ọlọ́rọ̀ tí ọ̀nà rẹ̀ rí pálapàla.
7 Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru, ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.
Ẹni tí ó pa òfin mọ́ jẹ́ olóye ọmọ ṣùgbọ́n ẹni tí ó bá ẹ́ jẹgúdújẹrá kẹ́gbẹ́ dójútì baba rẹ̀.
8 Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye, na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.
Ẹni tí ó mú ọrọ̀ rẹ̀ di púpọ̀ nípa èrè àjẹjù ń kó jọ fún ẹlòmíràn, tí yóò ní àánú àwọn tálákà.
9 Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị, ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.
Bí ẹnikẹ́ni bá kọ etí ikún sí òfin, kódà àdúrà rẹ̀ jẹ́ ìríra.
10 Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ, ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara, ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.
Ẹni tí ó mú olódodo rìn ọ̀nà búburú yóò bọ́ sínú pàkúté ara rẹ̀ ṣùgbọ́n aláìlẹ́gàn yóò gba ogún rere.
11 Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe, ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.
Ọlọ́rọ̀ ènìyàn le è gbọ́n lójú ara rẹ̀ ṣùgbọ́n tálákà tí ó ní òye rí ìdí, rẹ̀.
12 Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ, ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.
Nígbà tí olódodo ń lékè ariwo ayọ̀ ta; ṣùgbọ́n nígbà tí ènìyàn búburú gorí òye, àwọn ènìyàn a na pápá bora.
13 Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.
Ẹni tí ó bo ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀ mọ́lẹ̀ kì yóò ṣe rere, ṣùgbọ́n ẹni tí ó bá jẹ́wọ́ tí ó sì kọ̀ wọ́n sílẹ̀ máa ń rí àánú gbà.
14 Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke, ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.
Ìbùkún ni fún ènìyàn náà tí ó bẹ̀rù Ọlọ́run nígbà gbogbo ṣùgbọ́n ẹni tí ó sé ọkàn rẹ̀ le bọ́ sínú wàhálà.
15 Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.
Bí kìnnìún tí ń ké tàbí Beari tí ń halẹ̀ ni ènìyàn búburú tí ń jẹ ọba lórí àwọn aláìlágbára.
16 Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya; ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.
Ọmọ-aládé tí ó ṣe aláìmòye púpọ̀ ní ń ṣe ìwà ìkà púpọ̀ pẹ̀lú, ṣùgbọ́n èyí tí ó kórìíra ojúkòkòrò yóò mú ọjọ́ rẹ̀ pẹ́.
17 Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe ruo ala mmụọ. Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.
Ẹni tí ọkàn rẹ̀ kò balẹ̀ nítorí ẹ̀ṣẹ̀ ìpànìyàn yóò máa joró rẹ̀ títí ikú má ṣe jẹ́ kí ẹnikẹ́ni ràn án lọ́wọ́.
18 Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe, ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.
Ẹni tí ń rìn déédéé ní yóò là, ṣùgbọ́n ẹni tí ọ̀nà rẹ̀ jẹ́ àyídáyidà ni yóò ṣubú lójijì.
19 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.
Ẹni tí ó bá ro ilẹ̀ rẹ̀ yóò ní oúnjẹ lọ́pọ̀lọ́pọ̀ ṣùgbọ́n ẹni tí ń lé ohun asán yóò kún fún òsì.
20 Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
Olóòtítọ́ ènìyàn yóò rí ìbùkún gbà gan an ṣùgbọ́n ẹni tí ojú ń kán láti di ọlọ́rọ̀ kì yóò lọ láìjìyà.
21 Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.
Ojúsàájú ṣíṣe kò dára, síbẹ̀ ènìyàn kan ń ṣẹ̀ nítorí òkèlè oúnjẹ kan.
22 Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
Ahun ń sáré àti là kò sì funra pé òsì dúró de òun.
23 Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
Ẹni tí ó bá ènìyàn kan wí yóò rí ojúrere ni nígbẹ̀yìn ju ẹni tí ó ní ètè ẹ̀tàn lọ.
24 Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.
Ẹni tí ó ja baba tàbí ìyá rẹ̀ lólè tí ó sì wí pé, “Kì í ṣe ẹ̀ṣẹ̀,” irú kan ni òun àti ẹni tí ń pa ni run.
25 Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
Ọ̀kánjúwà ènìyàn a máa dá ìjà sílẹ̀, ṣùgbọ́n ẹni tí ó bá gbẹ́kẹ̀lé Olúwa yóò gbilẹ̀.
26 Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.
Ẹni tí ó gbẹ́kẹ̀lé ara rẹ̀ jẹ́ aláìgbọ́n ṣùgbọ́n ẹni tí ń rìn nínú ọgbọ́n wà láìléwu.
27 Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.
Ẹni tí ó ń fi fún tálákà kì yóò ṣe aláìní ohunkóhun, ṣùgbọ́n ẹni tí ó di ojú rẹ̀ sí wọn gba ọ̀pọ̀lọpọ̀ ègún.
28 Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha, ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.
Nígbà tí ènìyàn búburú bá dórí ìjọba, àwọn ènìyàn a na pápá bora; ṣùgbọ́n nígbà tí ènìyàn búburú bá ṣègbé, àwọn olódodo ń gbilẹ̀ sí i.