< Ilu 26 >

1 Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.
Ndenge mvula ya pembe elimwaka na tango ya molunge, mpe mvula enokaka te na tango ya elanga, ndenge wana mpe lokumu oyo bapesi na zoba ekowumela na ye te.
2 Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere.
Ndenge ndeke ya moke oyo babengaka mwano ekendaka bipai na bipai to mbilambila epumbwaka-pumbwaka, ndenge wana mpe elakeli mabe ezwaka te moto oyo asali na ye mabe te.
3 Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ; otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.
Ndenge fimbu ezalaka malamu mpo na mpunda, mpe ekangiseli ezalaka malamu mpo na monoko ya ane, ndenge wana mpe fimbu ezalaka malamu mpo na mokongo ya zoba.
4 A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.
Kozongisela zoba te kolanda bozoba na ye, noki te okokokana na ye.
5 Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.
Zongisela zoba kolanda bozoba na ye, noki te akomimona moto ya bwanya na miso na ye moko.
6 Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu dịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.
Moto oyo atindaka sango na nzela ya zoba azali lokola moto oyo amikati makolo mpe amilukeli makambo.
7 Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije, otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.
Ndenge makolo ya ebosono ezalaka makasi te, ndenge wana mpe masese ezalaka na nguya te kati na monoko ya zoba.
8 Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide. Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ.
Kopesa zoba lokumu ezali lokola kotia libanga na ebambelo mabanga.
9 Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.
Lisese kati na monoko ya zoba ezali lokola etape ya banzube kati na loboko ya moto oyo alangwe masanga.
10 Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi, otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.
Moto oyo azwaka zoba to moleki nzela na mosala azali lokola soda oyo azokisaka moto nyonso na likonga.
11 Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ, otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.
Ndenge kaka mbwa ezongelaka kolia biloko oyo yango moko esanzi, ndenge wana mpe zoba azongelaka bozoba na ye.
12 Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya? Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.
Eleki malamu kotia elikya na zoba, na esika ete otia elikya na moto oyo amimonaka moto ya bwanya na miso na ye moko.
13 Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ, ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”
Moto ya goyigoyi alobaka: « Nkosi ekangi nzela! Nyama moko ya mabe ezali na kati-kati ya balabala! »
14 Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.
Moto ya goyigoyi abalukaka na mbeto na ye ndenge ekuke ebalukaka na biloko oyo efungolaka yango.
15 Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.
Moto ya goyigoyi akotisaka loboko na ye kati na bilei, kasi akokaka te kozongisa yango na monoko.
16 Nʼuche ya, onye umengwụ na-eche na ọ maara ihe karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.
Moto ya goyigoyi amimonaka ete azali na bwanya koleka bato sambo ya mayele.
17 Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.
Moto oyo akotaka makambo oyo etali ye te azali lokola moto oyo akangi mbwa na matoyi.
18 Dịka onye ara na-agba àkụ na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ,
Ndenge moto ya liboma abwakaka moto, makonga mpe kufa,
19 ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.”
ndenge wana mpe moto oyo akosi moninga na ye alobaka: « Ezalaki kaka mpo na kosala maseki! »
20 Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ, otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.
Soki bakoni ezali te, moto ekokufa; soki bato ya songisongi bazali te, koswana ekokita.
21 Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.
Ndenge makala engalaka na mbabola, mpe bakoni epelisaka moto, ndenge wana mpe moto oyo alinga koswana ayeisaka matata.
22 Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
Maloba ya moto ya songisongi ezalaka lokola bilei ya kitoko, ekitaka na esengo kino na libumu.
23 Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie, ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.
Maloba ya sukali ya moto ya motema mabe ezalaka lokola palata ya mbindo oyo bapakoli na mbeki basala na mabele.
24 Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha, ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya.
Moto oyo ayinaka moninga na ye amibombaka na maloba na ye, kasi atondi na lokuta kati na motema na ye.
25 Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.
Ata soki abimisi maloba ya esengo, kondimela ye te, pamba te makambo sambo ya mbindo ebombama kati na motema na ye.
26 Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya, ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya.
Akoki solo kobomba makanisi na ye ya mabe na maloba ya lokuta, kasi motema mabe na ye ekosuka se na koyebana na miso ya bato nyonso.
27 Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya. Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.
Moto oyo atimolaka libulu akweyaka ye moko kati na yango; mpe moto oyo atindikaka libanga, libanga yango ekozongela kaka ye moko.
28 Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha. Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.
Lolemo ya lokuta eyinaka bato oyo ezokisi, mpe maloba ya sukali ememaka libebi.

< Ilu 26 >