< Ilu 24 >

1 Ekwosola ndị ajọ omume ekworo, ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ.
Do not envy wicked men or desire their company;
2 Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara.
for their hearts devise violence, and their lips declare trouble.
3 Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.
By wisdom a house is built and by understanding it is established;
4 Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya, bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa.
through knowledge its rooms are filled with every precious and beautiful treasure.
5 Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.
A wise man is strong, and a man of knowledge enhances his strength.
6 Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ, nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.
Only with sound guidance should you wage war, and victory lies in a multitude of counselors.
7 Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu, ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama.
Wisdom is too high for a fool; he does not open his mouth in the meeting place.
8 Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ
He who plots evil will be called a schemer.
9 Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie, ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị.
A foolish scheme is sin, and a mocker is detestable to men.
10 Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu, ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.
If you faint in the day of distress, how small is your strength!
11 Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ. Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi.
Rescue those being led away to death, and restrain those stumbling toward the slaughter.
12 Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,” ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya? Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya? Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?
If you say, “Behold, we did not know about this,” does not He who weighs hearts consider it? Does not the One who guards your life know? Will He not repay a man according to his deeds?
13 Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.
Eat honey, my son, for it is good, and the honeycomb is sweet to your taste.
14 Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide.
Know therefore that wisdom is sweet to your soul. If you find it, there is a future for you, and your hope will never be cut off.
15 Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume. A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.
Do not lie in wait, O wicked man, near the dwelling of the righteous; do not destroy his resting place.
16 Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ. Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.
For though a righteous man may fall seven times, he still gets up; but the wicked stumble in bad times.
17 Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu. Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara.
Do not gloat when your enemy falls, and do not let your heart rejoice when he stumbles,
18 Nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ iwe iwe nʼihi ya megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ.
or the LORD will see and disapprove, and turn His wrath away from him.
19 Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.
Do not fret over evildoers, and do not be envious of the wicked.
20 Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.
For the evil man has no future; the lamp of the wicked will be extinguished.
21 Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.
My son, fear the LORD and the king, and do not associate with the rebellious.
22 Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?
For they will bring sudden destruction. Who knows what ruin they can bring?
23 Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.
These also are sayings of the wise: To show partiality in judgment is not good.
24 Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,” ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe.
Whoever tells the guilty, “You are innocent”— peoples will curse him, and nations will denounce him;
25 Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị.
but it will go well with those who convict the guilty, and rich blessing will come upon them.
26 Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.
An honest answer given is like a kiss on the lips.
27 Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.
Complete your outdoor work and prepare your field; after that, you may build your house.
28 Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu. Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?
Do not testify against your neighbor without cause, and do not deceive with your lips.
29 Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”
Do not say, “I will do to him as he has done to me; I will repay the man according to his work.”
30 Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche,
I went past the field of a slacker and by the vineyard of a man lacking judgment.
31 hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala.
Thorns had grown up everywhere, thistles had covered the ground, and the stone wall was broken down.
32 Elegharịrị m ya anya site na ya mụta otu ihe a:
I observed and took it to heart; I looked and received instruction:
33 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike
A little sleep, a little slumber, a little folding of the hands to rest,
34 ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
and poverty will come upon you like a robber, and need like a bandit.

< Ilu 24 >